The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 192 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Diocese of Ideato @20

ABU 1
 
Stanza 1
Nso, Nso, Nso!  Chukwu-Okike,
N'isi ututu ayi gabu abu nye Gi;
Nso, Nso, Nso! Onye-ebere,
Ato nim'Otu, Chukwu di ngozi.
 
Stanza 2
Nso, Nso, Nso! Ndi nso neto Gi,
Natuda okpu-ha n'iru oche-eze-Gi;
Cherubim na Serafim nada n'iru Gi,
Onye nori, nano, ganogide.
 
Stanza 3
Nso, Nso, Nso! Gi di ebube,
Anya ndi-nmehie apugh ihu otuto-Gi;
O bu nani I di nso: o digh ony'ozo
Zur'oke n'ike, na ihu-n'anya.
 
Stanza 4
Nso, Nso, Nso! Chukwu-Okike,
Olu-Gi dum n'igwe n'uwa geto aha-Gi.
Nso, Nso, Nso! Onye-ebere,
Ato nim'Otu, Chukwu di ngozi. Amen.
 

 


 
Abu 2
 
Stanza 1
Nso, Nso, Nso Chukwu
Eze di mgb'ebigh-ebi,
Ony'igwe n'uwa neto;
Ndi-m'ozi nabu abu,
Neto mgbe ebigh-ebi
Triniti nke di ngozi.
 
Stanza 2
Gi kere ihe nile,
Na Gi ka ha nadi ndu,
Gi nwe nsopuru nile:
Ihe nile neto Gi.
Neto mgb'ebigh-ebi
Triniyi nke di ngozi.
 
Stanza 3
Cherubim na Serafim
Ji nku-ha kpuch-iru-ha;
Otu nazu ibe-ya
Si, Nso, Nso, Nso;
Neto mgb'ebigh-ebi
Triniti nke di ngozi
 
Stanza 4
Aleluya! ayi neto
Nna, n'Okpara na Mo Nso,
Ato nim'Otu di nso;
Ayi soro usu nd'igwe
Neto mgbe ebigh-ebi
Triniti nke di ngozi. Amen.
 
 

 


Abu 3
 
Stanza 1
Nna, nk'igwe, Nke hur'ayi n'anya,
We cheputar'ayi ngbaputa,
Ayi nd'ojo gburu I ikpere;
Biko, gbaghar'ayi njo nile.
 
Stanza 2
Okpara, Okwu Chineke,
Onye-ngbaputa, n'Eze-ayi,
Ayi nd'ojo gburu I ikpere;
Wer'amara-Gi zoput'ayi.
 
Stanza 3
Mo Nso nke neme nkpur'obi
K'o puta na njo na onwu,
Ayi nd'ojo gburu I ikpere;
Nye ayi ike nke ndu ohu.
 
Stanza 4
Jehova . . . Nna, Okpara, Mo . . . .
Chineke, Ato, nim'Otu,
Ayi nd'ojo gburu I ikpere:
Gbahara nmehie, nye ayi ndu. Amen.
 


 
Abu 4
 
Stanza 1
Chineke Nna, nk'igwe,
Onye bi nim'ihe,
Ony'ebube.
Ihe nenwu nk'ukwu,
Ihu-n'anya d'ike,
Ony'anahugh anya,
Ayi neto Gi.
 
Stanza 2
Chineke Okpara,
Kraist Onye ghor'aru,
Onye-nzota.
Onye na n'aka nri
Nna nke di ebube,
Onu-nekwuru-ayi,
Ayi neto Gi.
 
Stanza 3
Chineke, Mo di nso,
Onye nenye ayi ndu,
Onye-nkasi.
Mo nke amam-ihe,
N'ihu-n'anya n'ike,
Onyinye nke igwe,
Ayi neto Gi.
 
Stanza 4
Madu nile n'uwa
Soro usu nk'igwe
To aha-ha Ya.
Otuto diri Gi,
Ato nime Otu,
Rue mgbe ebigh-ebi,
Chukwu di nso. Amen.
 
 

 
 
 
 
 
ABU 5
 
Stanza 1
Chineke Nna zite ngozi
Nye ayi, ndi zukoro n'ebe a:
Le ayi anya n'ihu-n'anya,
Bu umu nsopuru Gi.
 
 Stanza 2
Kraist Okpara zite ngozi,
Kwe k'ayiso uzo-Gi n'ezie;
Me k'Okwu-Gi ba n'obi-ayi,
Nye ayi ike nke ndu ohu.
 
Stanza 3
Mo nke di nso zite ngozi,
Wer'ike-Gi mej'ulo nka;
Mukwasi ndi di um'ala,
Kpughere ha amara-Gi.
 
Stanza 4
Chineke, Ato nim'Otu,
Nna, na Okpara na Mo Nso,
Eb'ayi nario I n'otu obi,
K'ayi fegide Gi mgbe nile. Amen.
 
 


 
Abu 6
 
Stanza 1
Nna di nso, nur'olum;
Gi bu Onye-nzotam;
Nanom nso mgbe nile,
Gi Onye-amara.
 
Stanza 2
Jisus, Onye-nwe-ayi,
Eze ndu n'ebube,
Ka mgbe ahu bia ngwa,
Mgbe m'gada n'iru Gi.
 
Stanza 3
Mo Nso, Onye-nkasi,
Nke bi nime obim,
Mazuru nkpam nile,
Doruem ndo-I, mem nke-Gi.
 
Stanza 4
Nso, Nso, Nso,
Bia, arapukwalam;
N'obim nke dia ala,
K'I gebi mgbe nile. Amen.
 
 

 


Abu 7
 
Stanza 1
Le, k'obi'ahu gesi di'ocha
Nke nabia n'iru-Gi;
Nelekwaswi ihe nso-Gi,
Nanuri onu n'obi n'obi'uto
N'iru Gi, Chineke.
 
Stanza 2
Mo ndi nsom och'eze-Gi
Nenwe onu aha;
O bu nani ha mara ya,
Ebe ha namaghkwa nmehie,
Ha adagh kwa ada.
 
Stanza 3
M'gesi ana, mu b'onye-njo,
Ony'obi gbachiri,
Bia n'iru Ya, Nke di egwu,
Mo nkem gesi ana hu Ya:
Ih'anakegh eke!
 
Stanza 4
Uzo di ayi gesi bilie
Ba nim'ihe ahu:
Otu Aja nke zur'ezu,
Ike Mo Nso Ony'amara,
Onu-nekwuru-ayi.
 
Stanza 5
O bu ndia nakwadebe ayi
Iru ebe-nso-Gi,
Umu ochichiri na njo
Gebi n'ihe ebigh-ebi
Site n'ihu-n'anya-I. Amen.

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 37 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.