Second Session Of The Eight Synod Of Diocese Of Ideato, Thursday April 29th - Sunday May 2nd, 2021 @ Cathedral Church Of St. Peter's Ndiawa
The Rt. Rev. Henry Okechukwu Okeke The Bishop of Ideato

 

2021 Ideato Citywide Crusade With Rev. Dr. Uma Ukpai At the Cathedral of St. Peter's Arondizuogu

The New Canons

Mama Ideato, Mrs Julie M. Okeke (JP)

 

Mama Ideato, Mrs Julie M. Okeke (JP)

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Calendar

Abu 102
 
Stanza 1
Mo Nso, si n'elu ridata,
Gi onye nasach'obi-ayi;
Ka akara nke amara,
Ji miri nkagb'ama ugbu a.
 
Stanza 2
Wusa ike-I ka Chineke,
Fesa obara nke Jisus;
Ka Nna, n'Okpara, na Mo Nso
Do umu Ndia umu Chukwu. Amen.
 
Abu 103
 
Stanza 1
Chukwu, Ike n'Olil'any'ayi,
Onye nkwa-I adigh-ada,
Nar'umu ndia mgb'ebigh-ebi
N'otu nd'I j'obara gba.
 
Stanza 2
Ayi ewer'Ah'ato-nso-Gi
Ka h'akara na miri;
Nario I k'I nye ha onodu
N'etiti umu nke-Gi.
 
Stanza 3
Ayi kara obe-I n'iru-ha,
Ih'ama nk'ahuhu-Gi;
Ka nkwa ha kwer'ugbu a buru
Nkwuputa ndu-ha nile.
 
Stanza 4
Ekwela, Nna, ka ndu n'onwu
Kewapu ha n'eb'I no;
Ka ha kwesi ntukwas'obi,
Buru nke-I mgb'ebigh-ebi. Amen.
 
 
Abu 104
 
Stanza 1
Jisus, ayi cher'obi'ayi n'iru I,
Kunyer'ayi No Nso-Gi;
K'eme umu-nta ndia baptism
B anime onwu-Gi.
 
Stanza 2
Nye obi-ha amara-Gi,
Te manu nke-Gi;
Udi-Gi n'aha-Gi di nso
De nim'obi-nro-ha.
 
Stanza 3
K'ewer'ez'okwu ke n'ukwu
Ndi-oru oma ndia;
Ka ha ket'ihu-n'anya-Gi,
Buru ndi neso Gi.
 
Stanza 4
Kraist, kuny'ayi nile n'onwu-Gi,
Ayi we gosi ndu-Gi
Ndi-nketa nk'obe-Gi n'uwa,
Nk'okpu-eze-I n'igwe. Amen.
 
 
Abu 105
 
Stanza 1
Gi ony'ogu obe,
Guzo, kwe nkwa nke-gi,
Na I gag'uwa n'ih'efu
N'ihi aha Jisus.
 
Stanza 2
Bilie, k'eme I baptism,
Sachapu nmehie-gi;
Gin a Chineke gba ndu ta,
Kwuput'okwukwe-gi.
 
Stanza 3
El'igwe bu nke-gi,
O bu Kraist nwere gi;
Aha-gi na nke ndi nso dum
K'edekoro n'otu.
 
Stanza 4
Yir'ih'agha Chukwu,
Guzogid'Ekwensu;
Ogu ahu gesi ike,
Ma nmeri gabu nk'ayi.
 
Stanza 5
Okpu-nmeri genwu,
Ab'onu di uto,
Mgb'okwukwe gatogb'olu-Ya
 N'ukwu nk'onye-nwe-ayi. Amen.
 
 
ABU 106
 
K 'I ghar' it' ujo ib' onye
Nke Kraist akpogburu,
Ayi aka obe- Ya n'iru-i
Me gi nani nke-Ya.
 
K'ihere ghara ime gi
Ito aha nso-Ya,
Ayi me K'aput'ihe n'iru-i
Nleda n'otuto-Ya.
 
K'I ghar'ilaghachi azu
N'iluru Kraist ogu
N'okpuru okoloto -Ya
Jis'ike ka nwoke.
 
K'I mara na I ghagh iso
Uzo nk'O gafere,
Buru obe, lel'ihere.
Nodu ala n'igwe.
 
Ayi si otu a n'iru ora
Ka gi nke- Ya n'ezie;
K'iru nke nebu obe- Ya
Keta okp'eze- Ya!
Abu 107
 
Stanza 1
Chukwu nk'onyinye otuto-
Amara ayi ji nacho Gi;
Mgb'ayi putur'ihe n'iru Gi,
Ny'yi okwukwe k'ayi norue nso.
 
Stanza 2
Natukwas'obi n'ez'okwu-I,
Ayi togbo aku nk'I nyere
N'ebe a n'ir'och'eze Jisus,
K'I zulite ya n'ih'igwe.
 
Stanza 3
Gi were ya nye ayi nwa mgbe,
Ayi nyeghachi y'ebigh-ebi,
Namata na mgb'o diri I ndu,
Ayi, bu ndi nyere, nwe ngozi.
 
Stanza 4
Ngozi ukwu, nke bar'uba
Dik'ekper'ayi, di n'isi-ya;
Zowusa obi-y'amara
K'ayi nefesa ya miri nka.
 
Stanza 5
Me ya nwa-Gi, chebe kwa ya
Onye nes'uzo Onye-nw'ayi,
Ony'amara n'ihu-n'anya,
Onye nketa al'ez'igwe. Amen.
 
 
Abu 108
 
Stanza 1
Nna, chebe umu-ayi;
Ayi amagh ihe nke nabia n'uwa;
N'okpuru ndo nku el'igwe nke-Gi
Debe ha: Gi onye nyere ha ndu.
 
Stanza 2
Nna, biarute ayi nso;
K'aka-nchegide-Gi di n'isi-ayi;
Makua umu-ayi nso n'akuku-Gi,
Ha we di n'udo n'oge og'uwa.
 
Stanza 3
Zo ha n'im'ulo-Gi;
Zo ha, debe kwa ha n'idi-ocha,
Mgbe njo na nchehie bar-uba n'uwa;
Mgb'Ekwensu nanwa, n'agu-njo nadi.
 
Stanza 4
Nedebe ha na nso,
Nemwegh ntupo nim'onwunwa nk'uwa;
Ka ha we soro ayi n'uwe ocha,
Ba nim'on'uzo igwe na nmeri. Amen.
 

Primate

His Grace, The Most Revd. Henry Chukwudum Ndukuba

Admin

Who's Online

We have 93 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe

Rt Rev'd Henry Okeke

Bishop's Last Change at St. Paul's Urualla

Bishop's Last Change at St. Paul's Urualla

Lent Dates for 2021

Lent Dates for 2021

*ASH WEDNESDAY:* February 17, 2021

*PASSION SUNDAY:* March 21, 2021

*PALM SUNDAY:* March 28, 2021

*HOLY MONDAY:* March 29, 2021

*HOLY TUESDAY:* March 30, 2021

*HOLY WEDNESDAY:* March 31, 2021

*MAUNDY THURSDAY:* April 1, 2021

*GOOD FRIDAY:* April 2, 2021

*HOLY SATURDAY:* April 3, 2021

*EASTER SUNDAY:* April 4, 2021

*EASTER MONDAY:* April 5, 2021

*_Please Kindly Take Note Of This Post & Share To Love One's._*