The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 251 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Abu 109
 
Stanza 1
Jisus, ekwerewom nkwa
Ife I rue ogwugwu;
Biko, no nsom mgbe nile,
Onye-nwem n'Enyi nkem.
 
M'gagh-atu egwu agha
M'I nodu n'akukum;
M'gagh-ejehie n'uzo-Gi
M'I buru Onye-ndum.
 
Stanza 2
Ka m'mata na Gi no nsom,
Uwa no nsom mgbe dum;
M'nahu ih'isu-ngongo,
M'nanu ol'onwunwa.
 
Nd'irom no nsom mgbe nile,
No nimem, n'akukum;
Ma Jisus, bia nsom kari,
Gbopur'obim nmehie.
 
Stanza 3
Biko, ka m'nuru okwu-I,
Olu d'ezie nwayo,
Nke kar'olu agu-njo,
N'olu nnupu-isim.
 
Kwue k'I we kasiem obi,
Gbam ume, jidekwam;
Biko, kwue, me ka m'ge nti,
Gi Onye-nche obim.
 
Stanza 4
Jisus, Gi kwere nkwa nye
Ndi nile neso Gi,
N'ebe I no n'otuto,
Eb'ahu ndi-Igano.
 
Jisus, ekwerewom nkwa
Ife I rue ogwugwu;
Nyem amra ka m'neso
Onye-nwem n'Eyi nkem.
 
Stanza 5
Biko, ka m'hu nzo-ukwu-I,
Zonye nkem nime ha;
Olil'anya na m'geso
Bu nani n'ike-Gi.
 
Biko, kpom, dorom, nedum,
Nejidemmgbe nile;
Kpobatakwam n'el'igwe,
Onye-nzotam n'Enyim .Amen.
 
 
Abu 110
 
Stanza 1
Jisus, eburuwom obem
Irap'uwa sobe Gi;
Ogbnye eledar'anya,
I gabu ihem nile.
 
K'ihe m'ler'anya la n'iyi,
Ihe m'choro, nke m'mara !
Le k'onodum si di elu,
Chineke n'igwe bu nkem !
 
Stanza 2
Madu gesogbum, kpagbukwam,
Ogeme ka m'gbakute I;
Onwunwa-ndu gabikwasim,
Igwe gwet'iz'ike.
 
Ahuhu agah-ewutam
Mgbe ihu-n'anya-I bu nkem;
Onu agah-atom uto,
Nke nesitegh n'aka-Gi.
 
Stanza 3
Nara nzoputa-I, nkpur'obim;
Merie nmehie na nchegbu;
Nuria, n'onodu o bula
I gachot'olu di nkpa !
 
Cheta Mo Nso bi nime gi,
Chet'ihu-n'anya nke Nna;
Chet'Onye-nzota nke nwuru:
Nwa nk'igwe, atamula !
 
Stanza 4
Si 'amara ba n'otuto,
Jid'okwukwe n'ekpere;
Ndu ebigh-ebi di n'iru,
Chineke geduzi gi.
 
Ozi-gi n'uwa gebi ngwa,
Ubochi ije-I gagwu;
Olil'anya nenwe nmezu,
 Ekpere gagh'otuto. Amen.
 
Abu 111
 
Stanza 1
Chukwum, nara nkpur'obim ta,
K'O buru nke-I mgbe dum;
Ka m'ghar'irapu Gi kpafue,
Ghar'idaghach'azu.
 
Stanza 2
N'iru obe nk'Onye nwuru,
Le, ka m'gbur'ikpere;
Kwe k'akpogbue nmehie nile,
Ka Kraist bur'ihe dum.
 
Stanza 3
Tem manu amara nk'igwe,
Me kwa ka m'buru nke-I;
Ka m'hu iru otuto-Gi,
Fe Gi n'och'eze-Gi.
 
Stanza 4
K'echiche, n'olu n'okwu dum
Buru nke-Gi mgbe dum;
Jisus, ka m'were ndum fe Gi;
Onwu gab'uz'igwe ! Amen.
 
 
Abu 112
 
Stanza 1
Nke-I mgbe dum! Chukwu oma,
Si n'igwe nur'olu-ayi;
K'ayi buru nke-Gi mgbe dum,
Ugbu a na mgb'ebigh-ebi.
 
Stanza 2
Nke-I mgbe dum ! Onye-nwe ndu,
Cheb'ayi n'ogu nk'uwa nka;
Gi b'uzo, Ndu, n'Ezi'okwu:
Dur'ayi la n'ala ihe.
 
Stanza 3
Nke-I mgbe dum ! ha di ngozi,
Ndi nwer'iz'ike na Gi;
Onye-nzotam n'Onye-nchem,
Lur'ayi ogu mgbe nile.
 
Stanza 4
Nke-I mgbe dum ! Jisus, cheb'ayi,
B'umu-aturu nke-Gi;
Ayi di ndu nani na Gi,
K'ayi keta ih'oma-Gi.
 
Stanza 5
Nke-I mgbe dum ! Onye-ndu-ayi,
Nkp'ayi nile ka Gi negbo;
I gagbahara njo-ayi,
Si n'uwa dul'ayi n'igwe. Amen.

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 36 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.