The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 313 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Ab 125
 
Stanza 1
 
Bia, Mo Nso, Kwalie obi ayi
Muye oku nk'elu igwe
Gi bu Mo nke nete manu
Nke nenye onyinye asa;
Otite manu- I di ngozi
Bu nkasi, ndu, n'ihu n'anya.
 
Stanza 2
 
Wer'ih ebigh-ebi yere
Any'ayi kpuru isi aka;
Wer'uba' amara-Gi te
Iru-ayi nke ruru inyi
Chua nd'iro-ayi, zite udo;
Eb'I nedu, egwu adigh.
 
Stanza 3
 
Me k'ayi mara na Gi, na Nna,
Na Nwa bu otu Chineke
Ka nka we buru abu-ayi
Rue mgbe nile ebigh-ebi
Otuto diri olu-Gi,
Nna, na Okpara, na Mo Nso. Amen
 
 
Abu 126
 
Stanza 1
Chineke, wusa Mo Nso-Gi,
Gozie ndi-oru-Gi n'ebe a;
Nye ha onyinye n'amara,
Ka nd'uko-I yir'ez'omume.
 
Stanza 2
Mgbe ha neguzo n'ulo nso-I
Izi ezi okwu k'I si zi,
Jisus, ka ndi-m'ozi-zi nenwu
Dika kpakpando n'aka-Gi.
 
Stanza 3
Nye h'amam-ihe n'okwukwe,
Obi-um'ala n'id'ike,
Ka ha nenwe ndi nke-I n'obi,
Hu ha n'anya dik'I si hu.
 
Stanza 4
Neche, nekpe, ghar'ida mba
Ehiehie n'abali nile;
Nado ndi-njo aka na nti,
Nazu umu-aturu-Gi.
 
Stanza 5
Ka mgb'olu-ha gagwu n'uwa,
Ha wer'olil'anya lubie;
Mgbe Ony'isi-nche-ayi gabia
Kwe k'ayi nah u buru ndi nke-I. Amen.  
 
 
Abu 127
 
Stanza 1
Chineke, wedat'onwe-Gi,
Nuru ekpere Nzuko-Gi,
N'ihi ndi gekwus'okwu-Gi,
Ndi jikere ije ozi-I.
 
Stanza 2
Nna, were ebere-I kunye
Ume ndu Mo Naso-Gi n'aru
Ndi akpor'izu aturu
Nke Kraist ji onwu-Ya gbata.
 
Stanza 3
Kraist, si n'aka-I amapuru,
Wukwasi ha onyi-Gi;
Ka ndi guzoro n'iru Gi
Neme uche-I n'ihu-n'anya.
 
Stanza 4
Mo di ngozi, binyere ha,
Nye amara ikp'ekpere;
K'ebe ha nedu aturu-I,
Ha we naga n'uzo di nkpa.
 
Stanza 5
Chukwu, zitere ha ike-I,
Chebe ha ka ha pua na njo;
Ka ha nogide nime Gi,
Nat'okpu nke ndu m'emesia. Amen. 
 
 
Abu 128
 
Stanza 1
Were ndum, Nna, k'o buru
Ih'edoro nso nye Gi;
Were ubochim nile,
Ka ha neru n'otuto.
 
Stanza 2
Wer'akam ka ha neme
K'ihu-n'anya-Gi si cho;
Were ukwum, me ka ha
Di nfe n'ije-ozi-Gi.
 
Stanza 3
Were olum, ka m'nabu
Abu nye nani Ezem;
Were irem, me k'o jue
N'ozi oma si na Gi.
 
Stanza 4
Were akum na egom,
O nwegh nke gafodurum;
Were uchem n'ikem dum,
Me ka o si di Gi nma.
 
Stanza 5
Wer'ochichom, me ya nke-I,
O gagh-abu nkem ozo;
Were obim: Gin we ya,
O gabu och'eze-Gi.
 
Stanza 6
Onye-nwem, ihu-n'anyam
Ka m'togboro n'ukwu-Gi;
Wer'onwem, agambu
Nani nke-Gi mgbe nile. Amen.  
 
 
Abu 129
 
Stanza 1
Jisus, gwam okwu, ka m'were
Olu di ndu kwuputa ya;
Ka m'cho kwa, otu I choro,
Umu-Gi ndi furu efu.
 
Stanza 2
Nedum, Jisus, ka m'nedu kwa
Ukwu ndi nke nawaghari;
Nazum, Jisus, ka n'were kwa
Manna zuz ndi agu nagu.
 
Stanza 3
Nyem ike'k'ebe m'neguzo
N'elu Nkume, d'ike na Gi,
M'geseti ak'ihu-n'anya
Nye ndi nagba ngba n'ahuhu.
 
Stanza 4
Ziem ihe, Jisus, ka m'zi kwa
Ih'ok'onu I gosiri;
Nye okwum nku ka ha feba
N'ebe-nzuzo nk'obi nile.
 
Stanza 5
Nyem izu ike uto-Gi.
Ka m'wer'ike nkasi-obi
Kwuru Gi okwu kwesiri
Nye nd'ike gwuru n'oge nkpa.
 
Stanza 6
Jisus, mejuem n'ozuzu-Gi,
Rue mgbe obim gejuputa
N'okwu n'echiche nenw'enwu,
Ito Gi, ko ihu-n'anya-I.
 
Stanza 7
Werem, Jisus, ma werekwam,
Ka m'nej'ozi-Gi k'I si cho;
Rue mgbe m'gahu iru ngozi-I,
Ket'iz'ike n'otuto-Gi. Amen.  
 
 
Abu 130
 
Stanza 1
Na nkwere nke zur'oke
Enyekwam Gi onwem;
Abuzum nani nke-Gi
Rue mgbe ebigh-ebi.
 
Stanza 2
Okpara hurum n'anya,
M'gabu nani nke-Gi;
Ihe m'bu na nke m'nwere
Gabu nke-I sit'ugbu a.
 
Stanza 3
Jisus, buru Eze nkem!
K'obim bur'och'eze-I;
Jisus, Onye-nzoputam,
O gabu nani nke-I.
 
Stanza 4
Jisus, bia buru Eze,
Bur'eze ihe dum!
Ka m'na Gi nti mgbe nile,
Nefe kwa Gi, Ezem. Amen.  
 
 
Abu 131
 
Stanza 1
Otu m'di ibu nke-I, Onye
Hurum n'anya, Eny'umu-nta,
Ka m'do onwem nso, ma nye Gi,
O jisus Kraist-Abiam.
 
Stanza 2
N'ututu onu nk'ubochim
Ka m'nye Gi ndum, mezu nkwa nkem,
Me ngwa, newezugagh ihe,
Wer'obim nile bia.
 
Stanza 3
Agamebi n'ihe mgbe dum,
M'galuru ih'oma olu,
Were ikem nile fe Gi,
Ya mere ka m'ji bia.
 
Stanza 4
Otu m'di, nwata, di ike,
Ibu ezi'onye k'ikem ra,
N'ihi ezi'omume na Gi,
Onye-nwe-ndum-Abiam.
 
Stanza 5
N'ihi Gi ka m'luzue olum,
We nata kwa okpu-nmeri,
Bia togbo ya n'ukwu nke-Gi,
Onye-nzotam-Abiam. Amen. 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 18 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.