Abụ 13-18 Chineke Ọkpara
- Details
- Written by Administrator
-
Category: Uncategorised
-
Published: 05 June 2019
-
Hits: 1325
ABU 13
Stanza 1
Aha Jisus di ok’uto
Na nti onye kwere;
O nakasi ya n’ahuhu,
Nachupu egwu-ya
Stanza 2
O nagwo oria nkpur’obi,
Najur’obi nsogbu;
O bu nri nke onye-agu,
Nenye izu-ike.
Stanza 3
Nkume ebe m’wuru ulom,
Otam n’Ebe-ngbabam;
Ulo-akum di mgbe nile,
Juputa n’amara.
Stanza 4
Jisus, Eyim, Onye nazum,
Ezem, Ony’ozizim,
Onye-nwem, na Ndum na Uzom,
Nar’otuto m’ji bia.
Stanza 5
Obim jiker’ike adigh,
Echichem jur’oyi;
Ma mgbe m’gahu Gi k’I si di,
Aghaghm itozu Gi.
Stanza 6
Ka m’kwusa ihu-n’anya-Gi,
Site n’ikem nile;
K’Aha-Gi nke tokar’uto
Nye obim ndu n’onwu. Amen.
Abu 14
Stanza 1
N’Aha nke Kraist Jisus
K’ora gb’ikpere,
Ire dum kwuputa
Eze nk’otuto;
O nato Nna uto
K’ayi kpo Y’Onye-nw’ayi,
Onye site na mbu
Bur’Okwu d’ike.
Stanza 2
O si n’igwe we bia
K’O we new Aha
N’onu ndi-njo nile,
Ndi nke O biara.
O bur’Aha ahu
Nke nenwegh ntupo,
Weta Ya na nmeri
N’ilugbu onwu.
Stanza 3
Umu-nnem, tue Y’aha
Nim’ihu-n’anya,
Ma me ya n’it’egwu,
N’obi di’um’ala;
O b’Onye-nzoputa.
Jisus Onye-nw’ayi;
Ony’ora ganefe,
Nenye nsopuru.
Stanza 4
Me Ya Eze n’obi;
Kwe ka O chupu
Ihe dum nadigh nso,
Na ihe b’ugha;
Me Ya Onye-isi
N’oge onwunwa;
K’uche-Ya duz’unu
N’ike na ihe.
Stanza 5
Umu-nnem, Jisus a
Gabia kwa ozo,
N’otuto nke Nna-Ya,
N’usu ndi-m’ozi;
Okpu-eze nile
Ha gabu nke-Ya;
Obi-ayi gakpo Ya
Eze nk’otuto. Amen
ABU 15
Stanza 1
Gi bu Uzo–O bu na Gi
K’ayi nagbanari njo;
Onye o bula gacho Nna,
Gacho Ya nime Gi.
Stanza 2
Gi b’Ezi-okwu–okwu-Gi
Nenye amam-ihe;
Gi nwer’ike inye uche,
Me k’obi di ocha.
Stanza 3
Gi b’ezi Ndu–nbilite-Gi
Nekwusa nmeri-Gi;
Ndi tukwasiri Gi obi
Gbanari onwu.
Stanza 4
Gi b’Uzo, Ez’okwu, na Ndu;
K’ayi mar’Uzo ahu,
Jid’Ez’okwu, new Ndu ahu,
N’onu ebigh-ebi. Amen.
ABU 16
Stanza 1
Jisus, uwem di ebube
B’ez’omume n’obara-Gi;
Mgbe uwa nile gagb’oku,
Agamanuri kwa onu.
Stanza 2
Ndu na onwu enwegh ike
Imebi uw’ebube nkem;
Uwe oma Jisus nenye
Nadi ohu rue mgbe nile.
Stanza 3
Mgbe m’si n’onwu, bilie ije
N’ulo omam di n’el’igwe;
Mgb’ahu, ngopum nile gabu:
Jisus di ndu, nwu kwa n’ihim.
Stanza 4
N’uboch’ahu m’gagh-at’ujo,
Onye pur’ibom ebubo?
Obara Jisus newepu
Nkocha, n’ihere nke nmehiem.
Stanza 5
Ka ndi nwur’anwu nur’olu-I;
Jisus, gwa ndi nke-Gi nuria;
Obara-I n’ezi-omume-I
Bu uwe ebube nke ha.
Stanza 6
Chuku nk’ihu-n’anya n’ike,
Kwe k’uwa mara ebere-I;
Ka okwu nke-Gi gbasa kwa,
Meri onwu na oku-mo. Amen.
ABU 17
Stanza 1
Jisus, Onye biri n’igwe,
Ridatara gho madu, nwua;
Nim’Akwukwo Nso k’ayi gahu
Aha madu oma O bu.
Stanza 2
O nejeghari neme nma,
Nemeghe anya ndi-isi;
Ndi nari’oria na ndi-ngwuro
O mekwa aru-ha d’ike.
Stanza 3
Nke kari nka O gwara ha
Ihe nke Chineke nacho;
O bu kwa onye-omiko,
O nege nti olu nwata.
Stanza 4
Ma O nwuru onwu ojo,
Akpogburu Ya n’osisi;
Aka-Ya O ji neme nma
Ka ha kpogidere n’obe.
Stanza 5
Ma Akwukwo Nso koro ayi
Ihe kpatara onwu-Ya;
O biara gho madu, ma nwua
K’ewe gbaghara nmehie ayi.
Stanza 6
Chuku gaghara ndi nario,
Nachos’ike ipu na njo;
K’ayi choba iru-Ya ngwa ngwa,
We ket’oke n’ebere-Ya. Amen.
ABU 18
Stanza 1
Onye-ngbaputam di kwa ndu;
Okwu nka neny’ezi onu!
O di ndu, Onye nwururi;
Ezem mgb’ebigh-ebi di ndu.
Stanza 2
O di ndu k’O nenyem ngozi,
Nariorom aririo n’elu;
O di ndu, we me ka m’bilie
Ba na nzoput’ebigh-ebi.
Stanza 3
O di ndu, Eyim, Ony’oma;
O gedebem rue mgbe onwu;
O di ndu, m’ganuri onu,
Jisus, Ajam na Eze nke.
Stanza 4
O di ndu, O gakporom la
Na ebe nke O dozirim;
O di ndu, k’ayi to aha-Ya;
Jisus di ndu mgb’ebigh-ebi. Amen.