Second Session Of The Eight Synod Of Diocese Of Ideato, Thursday April 29th - Sunday May 2nd, 2021 @ Cathedral Church Of St. Peter's Ndiawa
The Rt. Rev. Henry Okechukwu Okeke The Bishop of Ideato

 

2021 Ideato Citywide Crusade With Rev. Dr. Uma Ukpai At the Cathedral of St. Peter's Arondizuogu

The New Canons

Mama Ideato, Mrs Julie M. Okeke (JP)

 

Mama Ideato, Mrs Julie M. Okeke (JP)

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Calendar

Abu 132 
 
Stanza 1
Gi Ihu-n'anya, kachas'uche madu,
N'ekpere k'ayi nada n'och'eze-Gi,
Ka ha nwe ihu-n'anya nadigide,
Bu ndi I jikoro ebigh-ebi.
 
Stanza 2
Gi Ndu zur'ezu, nye ha nghota nke-Gi,
Nk'obi-oma n'okwukwe sir'ike,
Nk'olil'anya, n'ezi nkasi-obi,
Na ntukwasi-obi nenwegh egwu.
 
Stanza 3
Nye ha onu neme k'ahuhu di nfe,
N'udo neme k'og'uwa nka dajua;
Nye ubochi ndu-ha echi mara nma,
Mgbe chi gabo n'ihu-n'anya na ndu.
 
 
Abu 133
 
Stanza 1
Njiko nke di ngozi
N'ihu-n'anya Jisus!
Idi-n'otu nke obi-ayi
Yiri nke di n'elu.
 
Stanza 2
N'iruoch'eze Nna
Ayi nekpe ekpere;
Ochich'ayi, nkasi, nkpa, n'egwu,
N'olil'any'ayi b'otu.
 
Stanza 3
Ayi nweko ahuhu,
Neburit'ibu-ayi;
Ihe newuta ot'onye
Gewuta ibe-ya.
 
Stanza 4
Mgbe nwoke na nwanyi
Nekwe nkwa n'iru nna
Na ha gebi n'ihu-n'anya
Rue mgb'onwu gekewa:
 
Stanza 5
O bu nkwa nke di nso,
Di kwa ike n'ezie;
Ekwela k'ihe o bula
Me k'i jehie na ya.
 
Stanza 6
Tukwasi Kraist obi,
Wepu uche uwa;
O mawo adigh-ike-gi,
O genyere i aka.
 
Stanza 7
Mgb'ayi gapu n'ihe-ngbu,
N'olu na nmehie-ayi,
Ayi gebi n'ez'ihu-n'anya
Rue mgbe ebigh-ebi. Amen. 
 
 
Abu 134
 
Stanza 1
Chineke nke ihu-n'anya,
Ayi nario n'ihi madu ndia,
Ka ha jiko na nkwa di nso,
Buru otu na Gi.
 
Stanza 2
Mgb'ubochi dum juru n'onu,
Mgbe uzo-ha ma-kwa-ra nma,
Ka ha wer'okwukwe naga,
Buru otu na Gi.
 
Stanza 3
Mgbe nsogbu n'ahuhu biara,
Nma-ha we di ka ihe-njo,
Ka ha tukwasi Gi obi,
Buru otu na Gi.
 
Stanza 4
Ih'o bula gezute ha,
Ok'onu m'obu ich'uche;
N'ike n'amara-Gi ka ha
Buru otu na Gi.
 
Stanza 5
Ihu-n'anya, nonyere ha,
Ka ha zoro na Gi mgbe dum;
Eb'onwu apugh ikewa
Nd'I jikoro n'otu. Amen.  
 
 
Abu 135
 
Stanza 1
Chukwu, Nna, Ony'okike,
Onye j'ihu-n'anya
Jiko ndu abua n'otu
Nim'ogige iden:
Wer'onyinye-Gi ochie
Nye umu-Gi ndia ta:-
Ulo ebe onu di,
N'ezi ihu-n'anya.
 
Stanza 2
Jisus, Obia nenyezu
Dika na Galili,
Biko, nonyere ndia ta,
Bu ndi nakpoku Gi;
Mo k'onu-ha nke uwa
Gho manya nk'el'igwe;
Zi ha mgbe ha nanu ya
N'onyinye bu nke-Gi.
 
Stanza 3
Mo nke Nna, si n'el'igwe
Kukwasi ha ume;
Idi-ocha-Gi d'ike,
Ihu-n'anya-I di nro.
K'iru-Gi nechebe ha
Site na njo n'ogu;
Bur'onye-ndu nke ndu-ha,
N'Eze nim'obi-ha.
 
Stanza 4
Nna, mgbe I newugh ulo,
Owuw'ulo b'efu;
Jisus, mgb'i nazozigh ya,
Onu gagh'ihe-ngbu.
O digh ihe gekewa
Ndi I jikotara;
Ihu-n'anya Mo doro
Nso enwegh ogwugwu. Amen.  
 

Primate

His Grace, The Most Revd. Henry Chukwudum Ndukuba

Admin

Who's Online

We have 310 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe

Rt Rev'd Henry Okeke

Bishop's Last Change at St. Paul's Urualla

Bishop's Last Change at St. Paul's Urualla

Lent Dates for 2021

Lent Dates for 2021

*ASH WEDNESDAY:* February 17, 2021

*PASSION SUNDAY:* March 21, 2021

*PALM SUNDAY:* March 28, 2021

*HOLY MONDAY:* March 29, 2021

*HOLY TUESDAY:* March 30, 2021

*HOLY WEDNESDAY:* March 31, 2021

*MAUNDY THURSDAY:* April 1, 2021

*GOOD FRIDAY:* April 2, 2021

*HOLY SATURDAY:* April 3, 2021

*EASTER SUNDAY:* April 4, 2021

*EASTER MONDAY:* April 5, 2021

*_Please Kindly Take Note Of This Post & Share To Love One's._*