The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 251 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019


Abu 136
 
Stanza 1
O bu n'aka nke Jisus,
N'obi-nwayo nke-Ya,
Na ndo ihu-n'anya-Ya,
K'obim gezu ike.
Ge nti! olu ndi-m'ozi
Nabiarutem n'abu,
Site n'ala otuto,
N'osimiri enyo.
 
Chorus
O bu n'aka nke Jisus,
N'obi-nwayo nke-Ya,
Nando ihu-n'anya-Ya,
K'obim gezu ike.
 
Stanza 2
O bu n'aka nke Jisus,
Ka m'gapu na nchegbu,
Pua n'onwunwa nke uwa,
Njo agagh-emegbum.
Pua n'ihe-nwuta dum,
Pua n'it'ujom nile;
Onwunwa nta foduru,
Nani nw'anya-miri.
 
Stanza 3
Jisus, ebe-nzuz'obim,
Jisus nwuru n'ihim;
Na nkume ebigh-ebi
Ka m'gatukwas'obim.
Ka m'tachie obi n'ebe a,
Chere k'abali ga;
Rue mgbe chi igwe gabo
N'ala oma ahu. Amen.  
 
 
Abu 137
 
Stanza 1
N'utut'ubochi Nbilite
Obi n'aru zuk'ozo;
Akwa na ir'uju adigh
M'obu ngbu.
 
Stanza 2
N'ebe a ha kewara nw'oge,
Aru debe iz'ike,
Neche nimke ndaju di nso,
No n'ura.
 
Stanza 3
Nwa mgbe  k'aru ike gwuru
No n'ebe iz'ike-Ya;
Rue mgbe chi nke Easter oma
Bo-kwa-ra.
 
Stanza 4
M'obi natughri uche
Nekpesi ekper'ike
Tiwa n'ubochi Nbilite
Nim'abu.
 
Stanza 5
Obi n'aru ejik'ozo,
O digh ihe gekewa;
Teta nime udi nke Kraist,
Zue oke.
 
Stanza 6
A! Ima-nma n'oke onu
Nk'ubochi Nbilit'ahu,
Nke nagagh-agabiga kwa
Mgbe nile.
 
Stanza 7
N'utut'onu Easter ahu,
Ili nyeghach'ozu-ha;
Nna, na nne, na nwa, na nwa-nne
Zuk'ozo.
 
Stanza 8
Na nzuk'ahu kachasi nma,
Kraist, wet'ayi n'ikpe-azu;
K'ayi si n'onwu n'ikpe jide
Obe-Gi. Amen.  
 
 
Abu 138
 
Stanza 1
OLu agwuwo ugbu a,
Uboch'ogu agawo;
Onye-ije eruwo
N'ofe ozo n'ikp'azu.
 
Chorus
Nna, n'aka ncheb'amara-Gi
K'ayi rap'oru-Gi no  n'ura.
 
Stanza 2
Ehichaw'anya-miri,
Amawo ihe-nzuzo;
Ony'ikpe ka nma nekpe
N'eb'ahu olu nk'uwa.
 
Stanza 3
Onye-nche nebulata
Aturu nke fur'efu;
Na ndo-Ya nenwegh nkpafu
Agu agagh-achu ya.
 
Stanza 4
N'eb'ahu ndi kwara njo,
Ndi garh'anya n'obe-Ya,
Gamut'ihu-n'anya Kraist
N'ukwu-Ya na Paradais.
 
Stanza 5
Oku-ala-mo apugh
Imebi udo nke-ha;
Kraist gechebe ha ke-nk'oma-
Onye nwuru n'ihi ha.
 
Stanza 6
“ Aja lar'aja ”; ugbu a
Ayi ji nwayo nekwu nka;
Ayi neche n'olil'anya
Rue ubochi Nbulite. Amen.  
 
 
Abu 139
 
Stanza 1
N'ebe ak'ayi nenwe nsogbu,
N'ebe a nzuko nwe nkewa,
Nkewa adigh n'igwe.
 
Chorus
O gabu ih'onu,
O gabu ih'onu,
O gabu ih'onu,
Mgbe nkewa nagagh-adi.
 
Stanza 2
Ndi huru jisus n'anya
Galakuru Ya n'igwe,
Soro ndi nso n'elu.
 
Stanza 3
Umu-nta gebi n'igwe,
Ndi choro Nn'ayi n'ekpere
N'ulo-Ya n'uwa nka.
 
Stanza 4
Nd'ozizi-ayi gadi ukwu,
N'ihi n'ayi huru n'anya,
Ghar'ikewa ozo.
 
Stanza 5
Onu-ayi gadi ukwu,
N'ihi n'ayi gahu Jisus
K'O no n'och'eze-Ya.
 
Stanza 6
Ayi nile geji onu
Neto Kraist, bu Onye-nw'ayi,
Rue mgbe ebigh-ebi. Amen.  
 
 
Abu 140
 
Stanza 1
Ndi kwuru nwe ngozi,
Nez'ike na Jisus,
Ndi tukwasir'isi
N'obi-Ya mgbe nile.
 
Stanza 2
Ohu nke di ngozi,
Nenwegh ochichiri!
Ha hu Ihe nk'ihe,
Nke ha huru n'anya.
 
Stanza 3
H'aagafewo uwa,
Ya na ahuhu-Ya;
Ih'egwu nk'abali,
N'anwu nekpo oku.
 
Stanza 4
Jisus geduru ha
N'eb'ifufe adigh;
Eb'ahihia neto
Na nso is'iyi ndu.
 
Stanza 5
Nani ayi, ndi no nso
Ili, bu ndi kwara
Ih'oge gar'aga,
N'onyinyo foduru.
 
Stanza 6
Olu-ha n'iru-ha,
Ihu-n'anya ha ji-
Na mgbe-ya foduru,
Uwa amagh kwa ha.
 
Stanza 7
Ndi nwer'obi-oma,
Nche ikp'azu agwu!
Ayi nakwa n'ih'unu,
Atal'ayi, Kraist kwara!
 
Stanza 8
Ngwa ngwa mgbe chi gabo,
Olu oku Jisus
Nke ka onwu n'ike
Gasi, Bilie, nuria! Amen. 
 
Abu 141
 
Stanza 1
Mgbe ayi ruru n'ahuhu,
Mgbe anya-miri nagb-ayi,
Mgb'ayi nakwa ndi-ayi lara,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
 
Stanza 2
I yir'anu-aru-ayi,
I buru ihe-ngbu-ayi;
I gbapur'anya-miri,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
 
Stanza 3
I rubew'isi-I n'onwu,
wisiw'obara-ndu;
Adobar'ozu-I n'ili,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
 
Stanza 4
Mgbe obi neru uju,
Neche nmehie-ya nile;
Mgbe mo-ayi natu egwu,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
 
Stanza 5
Mgbe atan onwu naku
N'ihi obi-ayi nala;
Mgb'ubochi'ikpe-ayi di nso,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
 
Stanza 6
I mar'ihere na ngbu
N'ihi njo nabugh nke-Gi;
Ma I kwere ibu ha,
Jisus, Nwa Devid, nuru.
 
Stanza 7
I gabigara n'onwu,
I sachapuru njo-ayi;
I no n'aka-nri Chukwu,
Okpara Chukwu nuru. Amen.  
 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 69 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.