Abụ 142-145 Elu-Igwe
- Details
- Written by Administrator
-
Category: Uncategorised
-
Published: 07 June 2019
-
Hits: 2044
Abu 142
Stanza 1
Abum obia n'ebe a,
Igwe b'ulom;
Nani onye-ije,
Igwe b'ulom.
Ih'egwu n'ahuhu
Gbaram gburugburu;
Igwe bu ala-Nnam,
Igwe b'ulom.
Stanza 2
Ifufe fes'ike,
Igwe b'ulom;
Ije nkem di nkpunkpu,
Igwe b'ulom.
Ma mgbe nsogbu uwa
Geme ngwa gabiga,
Agamano n'udo,
Igwe b'ulom.
Stanza 3
N'akuku Onye-nwem,
Igwe b'ulom;
Agenyem otuto,
Igwe b'ulom;
Ebe ndi nso Chukwu
Nebi ebigh-ebi
Ka ha jesiri ije,
Igwe b'ulom.
Stanza 4
Agham-atamu kwa,
Igwe b'ulom;
Otu uwa dirim,
Igwe b'ulom.
N'ezie mu geguzo
N'aka-nri Onye-nwem;
El'igwe b'ala-Nnam,
Igwe b'ulom. Amen.
Abu 143
Stanza 1
Abal'adigh n'igwe;
N'uwa-ngozi ahu
Olu agah-agwu ike,
Olu b'ihu-n'anya.
Stanza 2
Akwa adigh n'igwe,
N'ihi na ndu n'onu;
Akqwa b'otu nim'ihe mbu
Nke gabigasiri.
Stanza 3
Nmehie adigh n'igwe,
N'etiti ndi-ngozi;
Uwe ocha-ha dizu nso,
Abu-ha di kwa nso.
Stanza 4
Onwu adigh n'igwe;
Ndi ruru n'eb'ahu
Eritawo anwugh-anwu,
H'agah-anwu ozo.
Stanza 5
Jisus, bur'Onye-ndu!
K'ayi gafe abali,
Akwa, nmehie nile, n'onwu,
Ayi we rue n'el'igwe.Amen.
Abu 144
Stanza 1
Ayi nekwu okwu banyere
Ala oma nke ndi-ngozi,
Nekwus'otuto-ya mgbe dum;
Gini k'ibi n'igwe gabu?
Stanza 2
Ayi nekwuam'ol'edo-ya,
Icho-nm'aja-obodo-ya,
Ih'ebube n'ih'uto-ya;
Gini k'ibi n'igwe gabu.
Stanza 3
Ayi nekwu n'ab'tuto-ya
Kachasi abu dum n'uto
Nke madu nabu n'el'uwa;
Gini k'ibi n'igwe gabu.
Stanza 4
Ayi nekwu ihu-n'anya,
Uwe nka ndi bi n'otuto,
Nzuko nke Okpara n'elu;
Gini k'ibi n'igwe gabu.
Stanza 5
Biko, Nna, nime njo na nma,
Dozie mo-ayi ila n'igwe;
Emesia ayi gamata kwa
Ih'o bu-ibi n'eb'ahu! Amen.
Abu 145
Stanza 1
Ala di mara nma kar'ihe,
Site n'okwkwe k'ayi ji hu ya;
Nn'ayi,n Chineke, nechere nay a
K'O doziri ayi eb'obibi.
Chorus
M'emesia, m'emesia,
Ayi gezuko n'ala om'ahu.
M'emesia, m'emesia,
Ayi gezuko n'ala om'ahu!
Stanza 2
Ayi ganabu n'ala om'ahu
Ab'uto ahu nke ndi-ngozi;
Mo-ayi gapu n'ihe-nwuta dum,
Ghara is'ude n'ih'iz'ike.
Stanza 3
O bu ezi Nn'ayi nke bi n'elu
K'ayi geny'otuto kwesiri Ya,
N'ihi onyiny'ihu-n'anya-Ya
Na ngozi nke nedo ndu-ayi nso. Amen.