Second Session Of The Eight Synod Of Diocese Of Ideato, Thursday April 29th - Sunday May 2nd, 2021 @ Cathedral Church Of St. Peter's Ndiawa
The Rt. Rev. Henry Okechukwu Okeke The Bishop of Ideato

 

2021 Ideato Citywide Crusade With Rev. Dr. Uma Ukpai At the Cathedral of St. Peter's Arondizuogu

The New Canons

Mama Ideato, Mrs Julie M. Okeke (JP)

 

Mama Ideato, Mrs Julie M. Okeke (JP)

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Calendar

Abu 146
 
Stanza 1
Tob'Onye kasi nso n'elu,
Tobe kwa Ya n'ogbu;
Okwu-Ya dum di ebube,
Uzo-Ya dum di nma.
 
Stanza 2
Amam-ihe Chineke-ayi!
Mgb'ihe dum joro njo,
Adam nk'abua biara n'ogu
Ib'Onye-ngbaputa.
 
Stanza 3
Ez'iju-n'anya! n'anu'aru
Nke dara nim'Adam,
Gebuso nd'iro agh'ozo,
Gebuso we merie.
 
Stanza 4
Onyinye kari amara
Nemezi anu'aru:
nnonye nke Chukwu Onwe-Ya,
Na udi-Ya di nso!
 
Stanza 5
Ihu-n'anya nenwegh atu,
K'O ji lur'ayi ogu!
Ibu aro n'aru na mo
K'O bur'umu-madu.
 
Stanza 6
Na nzuzo nime ogige,
N'ir'ora n'el'obe,
K'O zi ndi-Ya uzo ihu
Ahuhu na inwu.
 
Stanza 7
Tob'Onye kasi nso n'elu,
Tobe kwa Ya n'ogbu;
Okwu Ya dum di ebube,
Uzo-Ya dum di nma. Amen.  


Abu 147
 
Stanza 1
K'ora tobe ike Jisus,
Ka ndi-m'ozi Ya da,
Weputa okpu nke eze,
Bia me Ya Ez'ora.
 
Stanza 2
Me Y'Eze, ndi-ama Chukwu
Neguzo n'iru Ya;
To Ya, b'Onye unu soro,
Bia me Ya Ez'ora.
 
Stanza 3
Umu Isreal arotara,
Ndi agbaputara,
Kelenu Onye-nzoputa,
Bia me Ya Ez'ora.
 
Stanza 4
Ndi-njo, ndi napugh ichefu
Olulu di ilu,
Nagbas'ak'unu n'ukwu-Ya,
Bia me Ya Ez'ora.
 
Stanza 5
K'ebo nile n'asusu dum,
Naz'oku anakpo,
Bunye Ya ebube nile,
Bia me Ya Ez'ora.
 
Stanza 6
K'ayi soro ndi nso bi n'igwe
Da n'ala n'ukwu-Ya,
Soro n'abu ebigh-ebi,
Bia me Ya Ez'ora. Amen. 
 
Abu 148
 
Stanza 1
Obim, tob'Eze nk'el'igwe,
But'onyinye-I n'ukwu-Ya;
Nagbahara n'ozizo dirim,
Onye geto Ya dikam?
To Ya! To Ya!
To Ya! To Ya!
Tob'Eze nk'ebigh-ebi.
 
Stanza 2
To Ya n'ihi amara-Ya
Nk'O mere nn'ayi n'ahuhu;
To ya, b'Onye nenwegh ngbanwe,
O nenye ngozi n'uba.
To Ya! To Ya!
To Ya! To Ya!
O kwesi ntukwas'obi!
 
Stanza 3
O nemeso ayi dika Nna,
O mar'aigh-ike-ayi;
O kur'ayi nwayo n'aka-Ya,
Doput'ayi n'aka nd'iro.
To Ya! To Ya!
To Ya! To Ya!
Ebere-Ya nerusa.
 
Stanza 4
Ndi-m ozi, dur'ayi tobe Ya,
Unu nahu iru-Ya;
Anwu n'onwa da n'ukwu-Ya,
Ndi bi n'el'uwa nile.
To Ya! To Ya!
To Ya! To Ya!
Sor'ayi tob'Ony'amara! Amen. 
 
Abu 149
 
Stanza 1
Madu nile bi n'uwa,
Tobenu Chineke n'onu;
Werenu egwu febe Ya,
Unu bia n'iru Ya n'onu!
 
Stanza 2
Onye-nw'ayi bu Chukwu n'ezie,
O bu nani Ya kpuru ayi;
O si n'ayi bu aturu-Ya,
O bu Onye nenye ayi nri.
 
Stanza 3
Wer'otuto ba n'uloYa,
We4r'onu ba n'ogige-Ya;
Neto aha-Ya Mgbe nile,
O kwesiri ime otu a.
 
Stanza 4
N'ihi na Chineke di nma,
Ebere-Ya adigh-agwu;
Okwu-Ya neguzos'ike,
O gadigide mgbe nile.
 
Stanza 5
To Chineke, Onye-ngozi!
To Ya, ihe nile n'uwa!
To Ya, usu nke di n'igwe!
To Nna , n'Okpara, na Mo Nso! Amen. 
 
 
              
Abu 150
 
Stanza 1
K'ebo nile kpo isi'ala
N'iru och'eze Chineke;
Onye-nw'ayi bu Chukwu n'ezie,
Yak ere, pur'imebi kwa.
 
Stanza 2
Nani ike-Ya ker'uwa,
O ji aja kpua ayi madu;
Mgbe ayi kpafuru k' auturu,
O kpoghachi ayi n'ulo-Ya.
 
Stanza 3
Ayi geji abu ekele
Bia bulie olu-ayi n'igwe;
Uwa geji asusu-ya
Melue ogigie-I n'otuto.
 
Stanza 4
Nna, Iwu-Gi gazur'uwa,
Ihu-n'anya-I di n'ebe dum;
Ezi'okwu-Gi ganeguzo
Dika nkume mgb'ebigh-ebi. Amen. 
 
 
Abu 151
 
Stanza 1
Chuku, mgb'obim nech'echiche
Ebere-Gi nile,
Otuto-ya n'ebube-ya
N'ebulite obim
 
Stanza 2
Nkasi anapugh'iguta
Ka nchebe nro-I nyere, 
Tutu obi nwatam mara
Ebe ha si puta.
 
Stanza 3
Mgbe uzo nile ka nwata
M’naga nechegh uche,
Aka –I na nzuzo cheberem
Rue mgbe m’tolitere.
 
Stanza 4
Mgb'oria nyerem nsogbu n'aru,
I bu Onye gworom;
Mgbe m'no na njo n'ahuhu, Gi
Wer'amara tutem.
 
Stanza 5
Mgbe nile m'nadi ndu n'uwa,
Idi-nma-I ka m'geso;
Mgbe m'nwuru, la n'uwa ozo,
M'gabu ab'otuto.
 
Stanza 6
Na ndu ebigh-ebi n'igwe
M'gekele Gi n'abu;
M'ebigh-ebi agagh-ezu
Itozu otuto-I. Amen.
 
Abu 152
 
Stanza 1
To Chuku Abraham,
Bu Eze n'el'igwe, 
Onye si na mgb'ebigh-ebi,
Nn'ihu-n'anya:
Chuku, ABUM di'uku,
Nk'uwa n'igwe neto:
Ka m'rub'isi gozie Aha-I
Di nso mgbe dum.
 
Stanza 2
To Chuku Abraham,
Onye nyere iwu,
M'we si n'aja bilie ch'onu
N'aka-nri-Ya.
Ajum ih'uwa dum,
Ike n'amam-ihe;
Nani ya bu okem n'otam,
Ulo-elum.
 
Stanza 3
Adaberem n'iyi
O ji Onwe-Ya nua;
Agamewere nku ugo
Rigo n'igwe.
M'gahu iru nso-Ya
Neto kw ike-Ya,
Bua abu nye amara-Ya
Rue mgbe nile.
 
Stanza 4
Ma ike uwa gwu,
Oku-mo megidem,
N'ala Kenan ka m'ga ije
Dik'O si kwu;
Gafe osimiri,
Nele Jisus anya,
Si n'ozara nekpo oku
Naga n'iru.
 
Stanza 5
Kal'oma ka m'nahu,
Nk'udo n'iju-afo;
Ala nk'inwe-onwem di nso,
Na iz'ike.
Manu-anu neru,
Manu ba-kwa-r'uba;
Osisi-ndu neto mgbe dum
Nim'ebere.
 
Stanza 6
Ez'ayi bi n'eb'ahu,
Ony'ezi'omume-ayi,
Nemeri uwa na nmehie,
Eze udo.
N'ugwu nso nke Zaion
K'al'eze-Ya di kwa;
Ya na ndi nso-Ya nim'ihe
Nabu eze.
 
Stanza 7
O nedebe ndi-Ya,
Chebe ha na nsoYa,
Neyikwasi uwe ocha
Nwuny'ohu-Ya,
Iyi nke onu nso,
Obi'uto nke di ndu,
Nkpuru oma nke Paradais,
K'O nenye ha.
 
Stanza 8
Chuku nke bi n'elu
Ka ndi-m'ozi neto,
Nasi “Nso! Nso! Nso!
Eze d'ike!”
“Onye nori, no kwa,
O gano mgbe nile;
Chineke, Nna, ABUM di'uku,
Ayi nefe Gi!”
 
Stanza 9
N'ir'Onye-nzoputa
Nd'agbaputara no,
Neti nkpu n'amara nke-Ya,
Ohu mgbe dum.
O gos'ihu-n'anya,
Obi-ha kpo oku,
Olu-ha dazue n'uwa dum,
“Nwa-aturu!”
 
Stanza 10
Usu nmeri nile
Neto Ya, “Ekele!
Nna na Okpara na Ma Nso!”
Mgb'ebigh-ebi.
“Ekele, Chinekem!”
Ka m'so n'abu nk'igwe;
“Ike, n'ebube, n'otuto
Bu nke-I mgbe dum!” Amen.
 
 
Abu 153
Praise, O praise our God and King.
 
Stanza 1
To Chineke, b'Eze-ayi;
Buanu abu otuto.
 
Chorus
N'ihi na ebere-Ya
Nadiru mgb'ebigh-ebi.
 
Stanza 2
To Ya na Ya ker'anwu
K'o nag'ije-ya mgbe dum.
 
Stanza 3
O ker'onwa nke neti,
Nenye ihe n'abali.
 
Stanza 4
To Ya, Ya zoro miri,
K'o me ji n'ubi ru mba.
 
Stanza 5
Ya siri ala ubi
K'o nami nkpuru n'uba.
 
Stanza 6
To Ya n'iwe ih'ubi,
O mejuwo oba-ayi.
 
Stanza 7
To Ya n'ihi nri ka nma,
Ihe-mbe ndu nk'el'igwe.
 
Stanza 8
Otuto dir'Eze-ayi,
K'uwa nile neto Ya;
Tobe Ato-nim'Otu,
Nna, n'Okpara, na Mo Nso. Amen.
 
Abu 154
 
Stanza 1
Otuto diri Chuku n'ih'O luru!
O hur'uwa n'anya, nye Okpara-Ya,
Nke togboro ndu-Ya ikpuchi nmehie,
Mehepu uzo ndu k'ora we bata.
 
Chorus
To Chuku! To Chuku! K'uwa nur'olu-Ya!
To Chuku! To Chuku! Ka madu dum nuria1
Biko, biakute Nna site na Jisos;
Nye Ya otuto n'ok'ihe O luru!
 
Stanza 2
Ezi ngbaputa nk'eji obara go!
Onye kwere ka nkwa Chineke diri,
Onye kachasi njo nke kwere n'ezie, 
Jisos gagbaghara nmehie-ya ugbua.
 
Stanza 3
Ok'ihe O zir'ayi, ok'ih'O luru,
Ok'onu k'ayi nwere site na Jisos;
M'ayi gananuri onu nke kachasi,
Neti nkpu n'ebube mgbe ayi gahu Ya. Amen.
 
Abu 155
 
Stanza 1
To Jisos, Onye ngbaputa nke di ngozi!
K'uwa nabu ok'ihu-n'anya-Ya;
Kele Ya, nd'isi-m-ozi nke bi n'otuto,
K'ike na nsopuru dir'Aha-Ya!
Jisos geche umu-Ya dik'aturu,
Kw'ubochi k'O neku ha n'aka-Ya.
 
Chorus
To Ya! To Ya! nekwu na Ya bu Okaka.
To Ya! To Ya! n'abu onu mgbe dum.
 
Stanza 2
To Jisus, Onye-ngbaputa nke di ngozi!
O nwuru n'ihi nmehie-ayi nile;
Ya bu nkume nzoputa ebigh-ebi-ayi,
Kele Jisos, Onye akpogburu!
Nye Y'otuto, Onye hur'ayi ahuhu;
Ihu-n'anya nke nenwegh ih'atu!
 
Stanza 3
To Jisos, Onye-ngbaputa nke di ngozi!
Hosanna nakpotu nim'el'igwe.
Jisos Kraist gabu eze mgbe ebigh-ebi:
Me Ya Eze, ndi nzuko-Ya nile!
O nabia dik'Onye-nmeri n'el'uwa,
Ike n'otuto diri Onye-nw'ayi! Amen.
 
Abu 156
 
Stanza 1
Tob'Eze nke ni n'otuto n'elu,
Bua abu nk'ike n'ihu-n'anya-Ya:
Ota n'Inye-ak'ayi, Ony'ochie k'O bu,
Onye bin'ebube, nkeyir'otuto!
 
Stanza 2
Ko amara-Ya, bu kwa ike-Ya,
Uwe-Ya b'ihe, ulo-Ya b'igwe;
Ugb'ala iwe-Ya nwer'igw'oji,
Uz'ochichiri-Ya di nim'ifufe.
 
Stanza 3
Chukwu, ike-Gi ker'uwa mgb'ochie,
N'ih'ebube dum di kwa nimw ya;
I ji ezi'ukpuru we kwagide ya,
Osimiri k'I ji yibe ya k'uwe.
 
Stanza 4
Nchebe-Gi nile, onye pur'iko?
Ume ayi neku, ihe nke nenwu!
O sitere n'ugwu rudata n'ala,
Wusa igirigi na mir'ozuzuo.
 
Stanza 5
Umu nke aja, ndi nadigh ike,
Ayi dabere Gi, na I kwesiri!
Eber'obi-nro-Gi di mgb'ebigh-ebi,
Eyi, Ony'okike, n'Onye-ngbaput'ayi!
 
Stanza 6
Ihu-n'any'ukwu! Ike kachasi!
Ebe ndi-m'ozi neto Gi n'elu,
Ayi ndi bi nim'uwa, n'ezi nsopuru,
Geji olu nwayo nabu otuto-I! Amen. 
 
Abu 157
 
Stanza 1
Ka m'nw'obi agbaputara
Na njo ito Chukwu!
Obi efesar'obara
Nk'awusirim n'efu.
 
Stanza 2
Obi nwayo, di um'ala,
Och'eze nk'Onye-nwem;
Eb'o bu nani Kraist nekwu
Nani Ya bu Eze.
 
Stanza 3
Obi-ncheghari, nekwere,
Nke di kw'ocha n'ezie;
Nke ndu n'onwu enwegh ike
Ikewapu na Gi.
 
Stanza 4
Obi nk'echich'ohu juru
N'ihu-n'anya di nso;
Nke zur'oke, di'ocha, di nma
Dika nke-I, Onye-nwem.
 
Stanza 5
Ony'amara, kenyem udi-I,
Si n'elu ridata;
De aha ohu-Gi n'obim,
Aha'ihu-n'anya. Amen. 

 

Abu 158
 
Stanza 1
Otuto na nsopuru
Dir'Onye-ngbaputa,
Onye nk'umu ntakiri
Tikuru “Hosanna!”
 
Stanza 2
Gi bu Eze nke Isreal,
Gi nwa Eze Devid,
Nke nabia n'aha Chukwu,
Eze nke di ngozi!
 
Stanza 3
Igwe usu ndi-m'ozi
Neto Gi n'el'igwe.
Madu n'ih'eker'eke
Naza ha n'el'uwa.
 
Stanza 4
Ora nile ndi-Hibru
Ji igu ga n'iru !;
Ekpere n'otuto-ayi
N'iru I k'ayi wetara.
 
Stanza 5
Ha bur'I ab'otuto
Tutu mgb'ahuhu-Gi;
Ugbu a k'I no n'el'igwe
Ayi nabu ab'uto.
 
Stanza 6
Otuto-ha toro Gi,
Nara ekpere-ayi:
Gi nk'ez'ihe dum nato,
Eze, Ony'amara! Amen. 
 
Abu 159
 
Stanza 1
Ihu-n'anya nke kachasi,
Onu nk'igwe bia n'uwa!
K'eb'obibi-Gi di nim'ayi,
Kpube ebere-Gi dum!
 
Stanza 2
Jisus, I juru n'omiko,
Gi bu ez'ihu-n'anya;
Were nzoputa-Gi let'ayi,
Ba n'obi natu egwu.
 
Stanza 3
Bia, Onye-nzoputa d'ike,
K'ayi nile nar'amara-I;
Bia na mberede, we ghara
Irapu obi'ayi ozo!
 
Stanza 4
Ayi ganagozi I mgbe nile ,
Nefe Gi dika nd'igwe;
Nekpe, neto Gi, nanuri
N'ihu-n'anya-I zur'oke.
 
Stanza 5
Kezue  okike ohu-Gi,
K'ayi di'ocha nenwegh ntupo;
K'ayi hu oke nzoputa-Gi,
Zu kwa oke nime Gi.
 
Stanza 6
K'eji otuto nenwogh'ayi,
Rue mgb'ayi ganodu n'igwe,
Togb'okpu-ez'ayi n'iru Gi,
Neto Gi n'ihu-n'anya. Amen. 
 
 
Abu 160
 
Stanza 1
Nuri onu nim'Onye-nw'ayi,
Unu ndi obi-ha di nma;
Unu ndi rota-kwa-ra Ya
Si nwuta na ir'uju la!
 
Chorus
Nuria! Nuria!
Nuria onu nim'Onye-nw'ayi.
Nuria! Nuria!
Nuria onu nim'Onye-nw'ayi.
 
Stanza 2
Nuria n'ihi n'O bu Eze,
Nachi n'uwa na n'el'igwe;
O ji okwu-Ya ke ihe,
O b'Onye-ngbaputa d'ike.
 
Stanza 3
N'ezie o foduru nwanti
Ka nd'iro-unu nwe nmeri;
Ma ndi-agha Chukwu zor'ezo
Kariri ndi nemegide.
 
Stanza 4
Ma ehihie gba ochichi,
Abali kpuch'iru-igwe,
K'uche ghara iche unu,
Tukwasi obi na Chukwu!
 
Stanza 5
Nuri onu nim'Onye-nw'ayi,
Weren'ubo, n'olu, n'obi
Netonu Ya n'ibu abu,
K'aleluya nada uda! Amen. 
 
 
Abu 161
 
Stanza 1
Agamet'Onye-ngbputam
N'ihu-n'anya O jirim;
N'obe k'O huru ahuhu
Ka m'pua n'obubu-onu.
 
Chorus
Biko, to Onye-ngbaputam!
Obara-Ya k'O ji gbam!
N'obe k'O kwusiri ugwom,
Me ka m'pua n'oru nmehiem.
 
Stanza 2
M'gako akuko ebube,
Otu O gbaputaram
N'ihu-n'anya n'ebere-Ya,
Mgbe m'fur'efu n'oke njom.
 
Stanza 3
Agamet'Onye-ngbaputam,
Nako ike nmeri-Ya;
Otu O si me k'ayi meri
Nmehie, n'onwu, n'oku-mo.
 
Stanza 4
Agamet'Onye-ngbaputam,
N'ihu-n'anya-Ya n'igwe;
O gbatawom n'onwu, nyem ndu,
Ka m'biyere Ya mgbe dum. 
Amen.
 
Abu 162
 
Stanza 1
O dim ka'nabu mgbe nile,
Emewo k'akwam bie;
N'ihi na Jisus bu Enyim,
Ka m'fe Ya kw'ubochi!
 
Chorus
Ka m'to Ya, to Ya, to Ya
Mgbe nile!
To Ya, to Ya, ka m'to Ya
Mgbe nile!
 
Stanza 2
Mgbe m'huru Onye-nwem n'obe,
Akpogburu n'ihim,
Akwaram akwa; ma ugbu a
Anameto mgbe dum.
 
Stanza 3
Mgbe onwunwa nanwa obim
Ka m' si “Jisus bu nkem!”
Anya-miri gagbam n'ezie,
M'anameto mgbe dum.
 
Stanza 4
Akuko Nw'aturu Chukwu
Were inu-gi ko,
Ka ndi'ozo wer'abu onu
Naga, neto mgbe dum. Amen. 
 
 
Abu 163
 
Stanza 1
Ka ndi nile bi n'el'uwa
Nye Ony'okike otuto; Aleluya!
K'asusu dum na'ala nile
Bua  aha Onye-ngbaputa, Aleluya.
 
Stanza 2
Nna,ebere-I di mgbe nile,
Ezi'okwu-I di ebigh-ebi; Aleluya!
Otuto-I geru nsot'uwa,
Rue mgbe anwu nagagh-adi. Aleluya! Amen. 
 
Abu 164
 
Stanza 1
K'ayi wer'abu onu soro
Ndi-m'ozi n'och'eze;
Apugh iguta onu-ha,
Ma onu-ha b'otu.
 
Stanza 2
Ha si “Nw'aturu kwesiri
K'ebulie Ya elu”;
Ayi naza, si “O kwesiri
N'ihi n'O nwuru ayi!”
 
Stanza 3
Jisus kwesiri k'O nara
Nsopuru n'ike nso;
Ngozi ka nke ayi pur'inye
Diri I mgbe dum, Ez'ayi!
 
Stanza 4
Okike nile nejiko
Igozi aha nso;
Nk'Onye nanodu n'och'eze,
Na ito Nw'aturu. Amen. 
 
 
Abu 165
 
Stanza 1
Mgbe chi boro n'igwe
Obim teta neti,
K'aneto Jisus Kraist!
Nim'ekpere n'olu
Ka m'jekuru Jisus:
K'aneto Jisus Kraist!
 
Stanza 2
Mgb'atan ulo-Chukwu
Nada n'elu n'ala,
K'aneto Jisus Kraist!
Ge nti! n;iho nabu,
K'o ji onu nada:
K'aneto Jisus Kraist!
 
Stanza 3
Mgb'ura nekwegh itu,
Nkpur'obim nas'ude.
K'aneto Jisus Kraist!
Mgb'echiche-njo nabia,
Nka gedebe obim:
K'aneto Jisus Kraist!
 
Stanza 4
Mgbe nwuta jur'obim,
Ebe a m'nahu nkasi:
K'aneto Jisus Kraist!
Mgb'onu nk'uwa nagwu,
Nka ganagbam ume:
K'aneto Jisus Kraist!
 
Stanza 5
N'ebigh-ebi nk'igwe
Abu nka kachasi:
K'aneto Jisus Kraist:
K'ala n'osimiri
Si n'ebe dum naza:
K'aneto Jisus Kraist!
 
Stanza 6
Mgbe nile m'nadi ndu.
Nka gabu abu nsom:
K'aneto Jisus Kraist!
Abu nka kasi nma
K'agabu n'ogbo dum:
K'aneto Jisus Kraist! Amen. 
 
Abu 167
 
Stanza 1
To Chineke, Ony'okike, Eze nk'uwa nile;
Obim, to Ya, n'ihi na Ya bu ndu na nzoputa-i;
Ndi nke nanu,
Ndikom na ndinyom bia nso,
Wer'obi'uto sopuru Ya.
 
Stanza 2
To Chineke, Nke nechebe gi, gozi kw'olu-gi;
Obi'oma n'ebere-Ya nechere gi kw'ubochi;
Tule y'ozo,
Ihe O puru ime
M'O hu gi n'anya dik'Eyi.
 
Stanza 3
To Chineke, Nke ji ebube nach'ihe nile;
Negbochiri i  ihe'ize-ndu, natute obi-gi;
I kalugh kwa
K'esi me ochiho-gi
N'ihe nk'O bur'uzo dozi?
 
Stanza 4
To Chineke, Onye, mgb'ochichi na njo bar'uba,
Mgbe ndi nemeb'iwu nacho imeri ndi-oma,
Nezisi'ihe,
Nacho ogwu abali,
Nemere ndi-Ya ebere.
 
Stanza 5
To Chineke! k'ihe nile nimem sopuru Ya!
K'ihe dum nek'ume wer'otuto bia n'iru Ya!
K'Amen nada
N'onu ndi nso-Ya ozo:
K'ayi to Ya n'onu mgbe nile. Amen.
 
Abu 168
 
Stanza 1
Chinekem, ekelem Gi, Onye ker'uwa,
Nke juru n'ebube n'onu, n'ihe na nma;
Otut'ihekwesir'otuto di n'ebe a.
 
Stanza 2
Ekelem Gi n'I mere k'onu ba uba;
Ihe nke di nwayo gbar'ayi gburugburu;
N'ebe gbakar'ochichi ihu-n'anya di.
 
Stanza 3
Ekelem Gi kari, n'onu nwere nwuta;
Oge nile nwer'onyinyo, ogwu nadi;
K'on'uwa buru ihe-ndu, o bugh nkporo.
 
Stanza 4
I mara, Nna,k'obi-ayi si we jid'uwa;
I we nye ayi onu di nro nke nwere nku,
Ime k'ayi hu ihe ka nso nenwu n'elu.
 
Stanza 5
Ekelem Gi, n'ihe kasi nma akabiagh;
Egboro nkp'ayi, m'ayi nel'anya ihe nke ka:-
Udo dik'omimi nk'ayi nahugh n'oge mbu.
 
Stanza 6
Ekelem Gi na nkpur'obi-ayi nwe ngozi;
Ma h'agagh-achota iz'ike zur'oke
Rue mgbe ha gadabere n'obi nke Jisus. Amen. 
 
Abu 169
 
Stanza 1
Mejue ndum n'akuku-ya dum
N'otuto, Chinekem,
K'arum nile we kwuputa
Odidi-Gi, n'uzo-I.
 
Stanza 2
O bugh nani ire n'obi
Ito Gi ka m'nario;
Kama, ndu nk'akuku-ya dum
Juru n'otuto-Gi.
 
Stanza 3
Otuto, n'ihe-kw'ubochi,
Nbata n'opupu-ya;
Otuto n'olu, n'omume
Nke dikariri nta.
 
Stanza 4
Mejue ndum nile n'otuto,
Ka m'we kwuputa Gi
N'ihu-n'anya, o bu ezie
Na m'bu ony'ogbenye.
 
Stanza 5
Otu a ka'I ganata n'akam
Otuto kwesiri I;
M'we malite n'uwa abu
Nke di ohu mgbe dum.
 
Stanza 6
Ehihie n'abali nile
Gabu oge di nso;
M'gesoro Gi nweko ihe
Na nzo-ukwum nile. Amen

Primate

His Grace, The Most Revd. Henry Chukwudum Ndukuba

Admin

Who's Online

We have 315 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe

Rt Rev'd Henry Okeke

Bishop's Last Change at St. Paul's Urualla

Bishop's Last Change at St. Paul's Urualla

Lent Dates for 2021

Lent Dates for 2021

*ASH WEDNESDAY:* February 17, 2021

*PASSION SUNDAY:* March 21, 2021

*PALM SUNDAY:* March 28, 2021

*HOLY MONDAY:* March 29, 2021

*HOLY TUESDAY:* March 30, 2021

*HOLY WEDNESDAY:* March 31, 2021

*MAUNDY THURSDAY:* April 1, 2021

*GOOD FRIDAY:* April 2, 2021

*HOLY SATURDAY:* April 3, 2021

*EASTER SUNDAY:* April 4, 2021

*EASTER MONDAY:* April 5, 2021

*_Please Kindly Take Note Of This Post & Share To Love One's._*