The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 192 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Diocese of Ideato @20

Abu 170
 
Stanza 1
Otu m'di-nenwegh agugo
M'obugh nani obara-Gi;
Obu Gi sim biakute Gi-
Nw'at'ru Chukwu, abiam!
 
Stanza 2
Otu m'di-o digh nke m'neche
Ka m'wepu nmehie di n'obim;
Obara-I gasachapu ya-
Nw'at'ru Chukwu, abiam!
 
Stanza 3
Otu m'di- anatugharim,
Obim nechegbu onwe-ya,
Ogu n'egwu nime, n'ezi!-
Nw'at'ru Chukwu, abiam!
 
Stanza 4
Otu m'di-Ogbeny'onu-ntu,
Anamacho aku nk'igwe;
I puru igbo nkpam nile-
Nw'at'ru Chukwu, abiam!
 
Stanza 5
Otu m'di-I gekwe naram,
Gbaharam, sachapu nmehiem,
N'ihi n'ekwerem nkwa nke-Gi-
Nw'at'ru Chukwu abiam!
 
Stanza 6
Otu m'di- ihu-n'anya-Gi
Ebupuwon ndachi nile;
Ugbu a ka m'nabu nani nke-I-
Nw'at'ru Chukwu abiam!
 
Stanza 7
Otu m'di-ka m'mara nk'oma
Omimi ihu-n'anya-Gi,
N'ebe a nw'oge, na n'el'igwe-
Nw'at'ru Chukwu abiam! Amen.
 
 
Abu 171
 
Stanza 1
Jisus, na mgb'ebere-I nka,
Tutu o gabiga,
Ayi gbu ikpere nario.
 
Stanza 2
Jisus nye ayi ncheghari,
Mehue obi-ayi n'egwu,
Tutu mgbe ikpe abia.
 
Stanza 3
Jisus, wukwas'ayi Mo-Gi,
Eb'ayi dara n'ukwu-Gi,
Tutu mgb'ebere agwu.
 
Stanza 4
N'ihi ibu-obi-Gi,
N'ihi akwa-ekpere-I,
N'ihi nkwere-onwu Gi,
 
Stanza 5
N'ihi akwa di ilu
Nk'I kwara Jerusalem,
Ekwel'ayi gbanari Gi.
 
Stanza 6
Ony'ikpe madu nile,
Mgb'ayi gahu iru n'iru,
Zob'ayi n'okpuru nku-Gi.
 
Stanza 7
O bu n'ihu-n'anya-Gi
K'ayi nadabere mgbe dum,
N'igwe k'ayi gamazu ya! Amen. 
 
Abu 172
 
Stanza 1
Onye-nw'ayi, nechetam,
Sachapu nmehie nkem;
Zoputam n'agu-njo uwa,
Me k'obim di ocha.
 
Stanza 2
Onye-nw'ayi, nechetam,
Nchekasi nakpagbum;
Ka m'buru ezi oru-Gi,
Mara iz'ike-Gi.
 
Stanza 3
Onye-nw'ayi, nechetam,
Ekwela ka m'kpafue;
Nim'ochichiri n'ich'uche
Gosim uzo igwe.
 
Stanza 4
Onye-nw'ayi, nechetam,
Mgb'ahuhu riri nne,
Mgbe ony'iro nemegidem,
Onye-nzotam, no nsom.
 
Stanza 5
Onye-nw'ayi, nechetam,
K'o gabu mgbe m'nwuru,
Ka m'hu ihe nk'ebigh-ebi,
Ket'oke n'onu-Gi.
 
Stanza 6
Onye-nw'ayi, nechetam,
Ka m'we bua n'el'igwe,
Neto Gi na Nna na Mo Nso
N'abu nke otuto. Amen.
 
Abu 173
 
Stanza 1
Mu, di njo, nacho ngozi,
Nacho ka m'puta n'oru,
Nechere izu-ike:
Chuku, merem ebere.
 
Stanza 2
Enweghm ezi agugo,
Nmehie di n'olum nile,
Nani nkpam ka m'nebute:
Chuku, merem ebere.
 
Stanza 3
Obi-ntiwa n'ihere
Ekweghm iweli anyam,
Ma Gi mar'ude m'nasu:
Chuku, merem ebere.
 
Stanza 4
Site n'obi-nmehie nka
Ka  m'gbakuru nani Gi;
Abugh nkem, kama nke-Gi:
Chuku, merem ebere.
 
Stanza 5
Onye no ns'och'eze-Gi
Ka m'tukwasiri obim;
Enweghm iye'aka ozo:
Chuku, merem ebere.
 
Stanza 6
Ya ganekwurum okwum;
Ya bu nkem, na n'ihi Ya,
Chuku, merem ebere. 
Amen.
 
Abu 174
 
Stanza 1
Onye-nwem, Gi ka m'kpokuru,
Aghagm inwu m'I nyeghm aka;
Werute nzoputa-Gi nso,
Werem otu m'si di!
 
Chorus
Werem otu m'si di,
Werem otu m'si di!
Jisus nwurum! bi aririom;
Werem otu m'si di!
 
Stanza 2
Ike adigh, ikpe maram,
Ma I wusirim obara-I,
I pur'imem ka I si cho;
Werem otu m'si di!
 
Stanza 3
Apughm ijikere onwem,
Ezi nzubem ka m'mebiri,
Ma zoputam n'ihi-I;
Werem otu m' si di!
 
Stanza 4
Onye-nzotam, lem n'ukwu-Gi,
Mesom ka osi di Gi nma,
Malite olu-I, lusia ya;
Werem otu m' si di! Amen.
 
Abu 175
 
Stanza 1
Nna, esetirim Gi akam,
Amaghm onye ozo;
I wezuga Onwe-I n'arum,
Ol'ebe ka m'geje?
 
Chorus
Ekwerewom, ekwerewom,
Jisus nwuru n'ihim;
Obara-Ya di ok'onu
Ka m'geji pua na njo.
 
Stanza 2
Le ahuhu Jisus huru
Tutu amuam n'uwa!
Le, ihe-ngbu O ji zotam
N'onwu ebigh-ebi!
 
Stanza 3
Jisus, o buru na m'gekwe,
M'gamata ike-Gi;
I gegborom ihe nile
Na mgbe ebere nka.
 
Stanza 4
Gi, Onye nenye okwukwe,
Ka m'welie anyam le!
Nyem onyinye ahu ugbu a,
K'obim ghara inwu. Amen.
 
Abu 176
 
Stanza 1
Agabigalam, Onye-nwem,
Nuru akwa nkem;
Mgb'I nakpo ndi ozo oku,
Agabigalam!
 
Chorus
Jisos, Jisos, nuru akwa nkem,
Mgb'I nakpo ndi ozo oku,
Agabigalam!
 
Stanza 2
Ka m'chota n'och-ebere-Gi
Iye'aka uto;
Nada n'ukwu-I na ncheghari,
Me ka m'kwes'ike.
 
Stanza 3
Natukwas'obi n'olu-Gi
Ka m'nacho iru-I;
Gwo onya n'obi-ntiwa nkem,
Zopum n'amara-I.
 
Stanza 4
Is'iyi nke nkasi-obim,
I kariri ndu!
Onye ka m'nwe n'uwa, n'igwe,
M'obugh nani Gi. Amen
 
 
Abu 177
Jesu, meek and gentle
 
Stanza 1
Jisos Onye nwayo
Nwa nke Chineke
Nur'akwa umu-Gi,
Onye-nzoputa
 
Stanza 2
Gbaghara nmehie-ayi,
Topu ayi n'agbu,
Tikpo arusi dum
Nke nejide ayi.
 
Stanza 3
Me k'ayi pua n'oru njo,
K'ayi hu Gi n'anya
Dor'ayi, Jisos di nso,
Rue n'ebe-I n'elu.
 
Stanza 4
Onye-ndu n'ije-ayi,
Gi bur'ayi uzo
Si n'ochichi nk'uwa
Rue n'ihe igwe.
 
Stanza 5 
Jisos, Onye nwayo,
Nwa nke Chineke,
Nur'akwa umu-Gi,
Onye nzoputa. 
Amen.
 
Abu 178
 
Stanza 1
Akw'apugh izoputam!
Anya-miri jum iru,
O pugh iwepu egwum
M'obu isachapu njom:
Akw'apugh izopum!
 
Chorus
Jisus kwara, nwua n'ihim;
O hur'ahuhu n'obe;
O necher'igbaputam;
Nani Ya gazopum!
 
Stanza 2
Olu'apugh izopum!
Ih'oma m'puru ime,
Echiche oma nile,
Apugh inyem obi'ohu:
Olu'apugh izopum!
 
Stanza 3
Necher'apugh izopum!
Anom n'ikpe-omuma,
M'anu olu ebere,
Agamanwu ma m'neche:
Ncher'apugh izopum!
 
Stanza 4
Okwukwe gazopum!
Ka m'tukwasi Kraist obi,
Kwere olu O luru;
Nna, dum ka m'gbakuru Ya:
Okwukwe gazopum! Amen.
 
Abu 179
 
Stanza 1
Onye-nzotam, nur'akwam,
Nur'akwam, nur'akwam;
O bu Gi ka m'gbakuru
Si n'obe-I zoputam.
Emehiewom, m'I nwuwo,
I nwuwo, I nwuwo;
Kwe ka m'zoro n'ebere-I,
Si n'obe-I zoputam.
 
Chorus
Eze Jisus werem,
M'gagh-emewuta Gi;
Onye-ngbaputa nkem,
Si n'obe-I zoputam.
 
Stanza 2
M'nala n'iyi! M'gekpere I,
Gekpere I gekpere I;
Gi bu ezi Uzo Ndu,
Si n'obe-I zoputam.
I nyer'amara-I n'efu,
Nye n'efu, nye n'efu;
Jisus, merem ebere,
Si n'obe-I zoputzm.
 
Stanza 3
Sachapum nim'obara-I,
Obara-I, obara-I,
Tunyem n'ebe o neru,
Si n'obe-I zoputam.
Okwukwe genye udo,
Nye udo, nye udo;
 N'okwukwe ka m'gejide I,
 Si n'obe-I zoputam. Amen. 
 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 94 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.