The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 192 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Diocese of Ideato @20

Abu 181
 
Stanza 1
Chukwu, Inye'ak'ayi na mgb'ochie,
Olil'any'ayi ugbu a,
Ebe izonar'ifufe,
N'Ulo ebigh-ebi!
 
Stanza 2
N'okpuru ndo och'eze-Gi
Ka ndi nso-I bi n'udo;
Nani aka-Gi ezuwo,
Ulo-elu d'ike!
 
Stanza 3
Mgb'edobegh ugwu n'usoro,
Tutu oke uwa,
Gi buri Chukwu mgbe nile,
Gabu kwa n'ogbo dum.
 
Stanza 4
Otutu aro n'anya-Gi
Di k'otu anyasi;
Di nkpunkpu ka nche ikp'azu
Tutu anwu awa.
 
Stanza 5
Oge nebupu umu-ya
K'iyi neru eru;
H'aga, echezo ha, ka nro
Furu ka chi nabo.
 
Stanza 6
Chukwu, inye'ak'ayi na mgb'ochie,
Olil'any'ayi ugbu a;
Bur'Onye-nche-ayi ka ndu ra,
N'Ulo ebigh-ebi! Amen. 
 
Abu 182
 
Stanza 1
Jisus, Enyi nke obim,
Ka m'gbaba n'okpuru Gi,
Mgb'osimiri nebili,
Mgb'ifufe nefes'ike.
 
Onye-nzoputam, zobem
K'ifufe ndu a gabiga;
Duum ga n'ala udo,
Biko, nara nkpur'obim.
 
Stanza 2
Enweghm ebe-ngbab'ozo,
Obim koro n'aru-Gi;
Biko, arapukwalam,
Kwagidem, kasiem obi.
 
Gi bu ntukwasi-obim,
Nani I nenyerem aka;
Biko, were udo nku-Gi
Kpuchie isi-oto nkem.
 
Stanza 3
Ihe nile nke m'nacho,
Kraist ahuzuwom na Gi;
Palitem, kasiem obi,
Gwo oriam, du ony'isi.
 
Aha-Gi bu aha nso,
Ejurum n'aj'omume;
Aghugho di nim'obim,
I juru n'ezi-okwu.
 
Stanza 4
Amara-Gi di ukwu,
O gekpuchi njom nile;
Me ka miri-ogwugwo
Sacham, debe kwam ocha.
 
Gi bu is'iyi nke ndu,
Ka m'nara miri n'efu;
Suputa nime obim
Rue na ndu ebigh-ebi. Amen.
 
Abu 183
 
Stanza 1
Okwukwem di na Gi,
Nw'aturu Kalvari,
Onye-nzotam.
Nur'aririom uhbu a,
Wepu nmehie nile;
Site n'ubuchi ta
Ka m'buru nke-I.
 
Stanza 2
K'amara-Gi nenye
Obim ike ohu
Nanu oku.
Eb'I nwuru n'ihim,
K'Ihu-n'anyam buru
Oku di nso nere
Mgb'ebigh-ebi.
 
Stanza 3
Mgbe m'nawa ohia ndu
N'etiti ahuhu,
Bur'Onye-ndum.
Chupu ochichiri,
Hichap'anya-miri,
Ekwela ka mkpafue
N'uzo nke-Gi.
 
Stanza 4
Mgbe ndum ka nro gagwu,
Mgb'osimri onwu
Geruchikwam;
Jisus, k'ihu-n'anya-I
Chupu egwum nile;
Buruem n'elu n'udo,
Onye-nzotam. Amen 
 
 
Abu 184
 
Stanza 1
Site n'ihu-n'anya Jisus
O gadi nma,
Ebere-Ya enwegh ngbanwe,
O diwo nma.
 
Obara-Ya di ok”onu,
Amara-Ya zuru oke,
Aka nechebe ayi d'ike:
O gadi nma.
 
Stanza 2
M'ayi nagafe nim'ahuhu,
O gadi nma;
Nzoputa nke-ayi zur'ezu;
O diwo nma;
 
Ayi kwere Chukwu, nwe onu;
Nime Kraist k'ayi gami nkpuru;
Mo Nso nedu ayi n'idi-nso;
O gadi nma.
 
Stanza 3
Ayi nel'anya echi oma,
O gadi nma;
Okwukwe nabu n'ahuhu,
O diwo nma;
 
Ayi daber'ihu-n'anya Nna;
Jisus negboro ayi nkpa dum;
Ayi di ndu m'obu ayi nwuru
 O gadi nma. Amen. 
 
Abu 185
 
Stanza 1
Natukwasi Ya obi-I,
Ma, ogu nan'odu;
I gabu onye-nmeri,
Chukwu galuru gi.
 
Chorus
Kwere! kwere!
M'abali gb'ochichi!
Kwere! kwere!
Chi-obubo di nso.
 
Stanza 2
Natukwasi Ya obi-I,
Ok'onwunwa di nso;
N'elu miri ize-ndu
O ganya ugbo-gi.
 
Stanza 3
Chukwu pur'izoputa ayi,
O bu ezi Enyi:
Natukwasi Ya obi-i
We rue n'ikp'azu ndu. Amen. 
 
Abu 186
 
Stanza 1
Chukwu, ka m'so uzo-I,
K'ochichiri-ya ra;
Wer'aka-Gi duziem,
Roputaram uzo.
 
Stanza 2
O di nma m'o di njo,
O gakachsi nma;
O gbago, zir'ezi,
O gedu n'iz'ike.
 
Stanza 3
M'gagh-ator'onodum,
M'nwe ike m'gagh-ekwe;
Chineke, rotaram,
Ka m'nagazi nk'oma.
 
Stanza 4
Al'eze nke m'nacho
Bu nke-Gi; ya mere
K'uzo-ya buru nke-I,
Ka m'ghara ikpafu.
 
Stanza 5
Wer'ikom mejue ya
N'onu m'obu n'uju;
Otu o di gi nma 
Rotaram njo na nma.
 
Stanza 6
Rotaram ndi-enyim,
Oriam, n'aru-ikem;
Rotaram ich'uchem,
Akum m'ob'ogbenyem.
 
Stanza 7
Nroputa abugh nkem,
N'ih'ukwu, n'ihe nta;
Bur'Onye-ndum, n'Ikem,
Uchem, n'Ihem nile. Amen. 
 
 
Abu 188
 
Stanza 1
Gi atula egwu;
Nel'anya Chineke,
O nuwo is'ude-I n'akwa-i
O gebul'isi gi,
 
Stanza 2
Nime nsogbu nk'uwa
O nakwara I uzo;
Chere mgbe-Ya abali nka
Gebi n'uboch'onu.
 
Stanza 3
O nachi ihe dum,
Ha nanu olu-Ya;
Olu-Ya nile bu ngozi,
Uzo-Ya bu ihe.
 
Stanza 4
O setia aka-Ya,
Gini ngegbochi Ya?
MgbO galuru ndi-Ya ogu,
Onye gemegide?
 
Stanza 5
Wer'ihe dum ny'Eze,
K'O naroputara i!
O geju i anya, i gasi,
K'ike aka-Ya ra!
 
Stanza 6
Kariri uche-gi,
Mgb'O luzuru olu ahu 
Nk'I turu egwu ya.
 
Stanza 7
Gi mara obi-ayi,
Hur'adigh-ike-ayi;
Newelite aka-nkuda,
Gba ikpere ume!
 
Stanza 8
Kwe k'ayi, na ndu n'onwu,
Kwusa ezi'okwu-Gi,
Na nchebe-Gi nile. Amen.
 
 
Abu 189
 
Stanza 1
Ekesiworom dum nile!
Nna, nka ka m'matara;
Ngbanwe dum nke naghagh ibia,
Atughkwam egwu ha;
Nyem obi um'ala ugbu a,
Nk'ihe-ya nato Gi.
 
Stanza 2
Nyem ihu-n'anya nwer'uche,
Site n'amam-ihe;
Ka m'wer'ochi onu naga,
Hicha kw'anya-miri;
Na nkpur'obi nke no n'udo
Ikasi ndi ozo.
 
Stanza 3
Achokwaghm uche nke nadigh-
Enwe izu-ike;
Nke nacho ime ih'ukwu,
N'imat'ihe-nzuzo.
Mesom dika nwatakiri,
Nedum n'uzo m'naga.
 
Stanza 4
N'eb'o bula m'gano n'uwa,
N'onodu o bula,
Aghaghm isoro ndi ozo
Nwe nmeko nke obi;
Lu-kwa-ra Ya, Onye n'nefe,
Olu nk'ihu-n'anya.
 
Stanza 5
Nyem ike ubochi nile,
Nk'I nenye ora dum;
N'uche iji di ndu n'uwa,
Ma nodu n'akuku-I;
O zuworom ino nwayo,
Nenye Gi otuto.
 
Stanza 6
Ije-ozi si n'ochicho-I
Adigh ekem agbu;
Obim namuta ezi'okwu
Nke natop'umu-Gi:
Na ndu nk'iju onwem aju
Bu ndu inwer'onwem! Amen. 
 
Abu 190
 
Stanza 1
Ezi udo, nim'ajo uwa nka?
Obara Jisus neny'udo n'obi.
 
Stanza 2
Ezi udo, mgbe olu nanyigbu?
Ime uche Jisus bu iz'ike.
 
Stanza 3
Ezi udo, n'etiti ahuhu?
N'akuku Jisus nani nkasi di.
 
Stanza 4
Ezi udo, mgbe ndi-ayi nanogh nso?
N'aka Jisus ayi na ha n'udo.
 
Stanza 5
Ezi udo, ma ayi amagh ochi?
Ayi mara Jisus: O no n'och'eze.
 
Stanza 6
Ezi udo, ma onwu no nso ayi?
Jisus emeriwo ike onwu.
 
Stanza 7
O diwo nma, og'uwa nke gebi;
Jisus gakpo ayi la n'udo nk'igwe. Amen.
 
 
Abu 191
 
Stanza 1
Mgb'udo, dik'osimiri, neru n'uzom,
Mgbe nsogbu biara k'ebili;
N'onodum o bula I mewom ka m'si,
“O di nma, o diri obim nma.”
 
Chorus
O di nma . . . o di nma;
O di nma, o diri obim nma.
 
Stanza 2
Ekwensu gesogbu, onwunwa gabi;
Ka m'tukwasi obim na nka:
Na Kraist amatawo na ike adighm,
We wusi obara-Ya n'ihim.
 
Stanza 3
Nmehiem-echiche nka nanyem ok'onu?
Nmehiem-ha nile, ka ha ra,
Di n'obe Jisus, ebughkwam ha ozo:
To Chukwu! to Chukwu, nkpur'obim!
 
Stanza 4
N'ebe m'no idi ndu bu Kraist mgbe nile!
O buru na onwu abia,
O gagh-ewutam; n'onwu dika na ndu,
I genye nkpur'obim Udo-Gi.
 
Stanza 5
Jisus, o b'obibia-G k'ayi nechere;
Ili agagh-ab'ulo-ayi:
Opi nke mo-ozi! olu nke Chukwu!
Olil'anya, n'iz'ike obim! Amen. 
 
Abu 192
 
Stanza 1
O gabu na m'gerit'uru
N'obara Onye-nzoputam?
O nwurruum; onye mere 
 
K'O nwe ihe-ngbu, ga n'onwu!
Ihu-n'anya! o gadi'ana
Na Gi, Chinekem, ganwurum?
 
Stanza 2
Ih'omimi! Okpar'anwua!
Onye gamata nzube-Ya?
N'efu ka ndi-m'ozi nanwa
 
Itu omim'ihu-n'anya.
Ebere! K'uwa sopuru!
Ndi-m'ozi, ajula ozo!
 
Stanza 3
O rapuru och'eze Nna-
Amara-ya nenwegh nsotu-
O mer'onwe-Ya ih'efu,
 
Gba obara n'ihi ndi-njo.
Ebere! enyere n'efu;
Chinekem, o choputaram!
 
Stanza 4
N'oge mbu mom eker'agbu
Togboro na njo n'ochichi;
Ihe-I nwubara, m'we teta;
 
Ulo-nkporo juru n'ihe;
Nkporom dapuru, m'nwer'onwem,
Ebilirim, pua, soro Gi.
 
Stanza 5
Atughm egwu ikp-omuma;
Jisos, n'ihe-Ya dum, bu nkem!
Adim ndu nime Ya: Isim;
 
Ezi'omume din so b'uwem.
N'ob'ike m'biarue ns'och'eze,
Nat'okpu-eze n'aka Kraist. Amen
 
 
 
 
Abu 193
 
Stanza 1
Chinekem, Nnam, me ka m'd'ike,
Mgbe olu nke ndu sir'ike,
Ikele ya n'abu-nmeri:-
K'eme uche-I!
 
Stanza 2
Dopu n'anyam ihe-nkpuchi
Ka m'hu, eb'ik'uwa nada,
N'ihu-n'anya-Gi gemeri:
K'eme uche-I!
 
Stanza 3
N'obi di um'ala m'gahu
Inwe-onwem n'ije-ozi,
Nekp'ekpere nim'olu dum:
K'eme uche-I!
 
Stanza 4
M'geme ihe kachas'ike;
Ikp'oku n'inye'aka bu nke-I;
Uche-Gi gedozi uzo;
K'eme uche-I!
 
Stanza 5
Ihe nile bu nkem ugbu a;
M'geguzos'ike nime nkwam,
Ebe o bugh mu, kama Gi:
K'eme uche-I!
 
Stanza 6
Olil'anya nelefe njo;
Okwukwe neti nkpu onu;
Ihu-n'any'agagh imeri:
JK'eme uche-I! Amen. 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 84 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.