The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 313 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Abu 206
 
Stanza 1
Umu nke Eze igwe,
Dik'unu naga, buanu,
Neto Onye-nzoputa;
Uzo-Ya di ebube.
 
Stanza 2
Ayi nalakuru Chukwu
N'uzo nke nn'ayi-ha gara;
Ugbu a ha nwere onu,
Ayi gesoro n'onu-ha.
 
Stanza 3
Umu Chukwu, tienu nkpu!
Unu gano n'och'eze
Nk'edoziri n'eb'ahu:
Al'eze n'ugw'ol'unu!
 
Stanza 4
Umu ihe, weli'anya,
Lenu obodo Zaion,
Ulo ebigh-ebi-ayi,
Ebe ayi gahu Jisus.
 
Stanza 5
Umu-nna, atul'egwu,
Guzo nso igwe n'onu!
Jisus Kraist, Okpara Nna,
Si, “Unu naga n'iru!”
 
Stanza 6
Chineke, ayi kwer'ila,
Were onu rap'uwa;
Nani bur'ayi Onye-ndu,
Ayi ganesogide Gi! Amen. 
 


Abu 207
 
Stanza 1
Nime abali nk'ahuhu
Nd'ije Chineke naga,
Nabu abu nk'olil'anya,
N'ala ekwere  na nkwa.
 
Stanza 2
N'iru ayi nim'ochichiri
Ihe nedu ayi nenwu;
Nwa'nne nejid'aka nwa-nne,
Nazo ije n'ob'ike.
 
Stanza 3
Ihe nk'iru Chukwu b'otu,
Namukwasi ndi-nkeYa,
Nachupu egwu na ngbachi,
Nenye ihe n'uzo-ayi.
 
Stanza 4
Nzube nk'ije-ayi bu otu,
N'okwukwe nadigh agwu,
N'olil'anya nanu oku
Nke Chineke natute.
 
Stanza 5
Abu nk'igwe madu nabu
Dika nke si n'ot'obi;
Otu agha, n'ih'ize-ndu,
Otu ije rue Chukwu.
 
Stanza 6
Otu inuri-onu di
N'al'ebigh-ebi ahu,
Ebe Nna nke kachas'ike
Nabu eze mgbe nile.
 
Stanza 7
Naga n'iru, ndi no n'ije,
K'obe bur'inye'aka-ayi;
Bur'ihere-ya lua ogu,
Ayi gez'ike na ndo-ya.
 
Stanza 8
Mgbe oke nbilite di nso,
Ili gemeghe oghe,
Onyinyo
 nile gagbasa
Ngbachi na ndogbu gagwu. Amen. 
 
Abu 208
 
Stanza 1
Nna nk'igwe, biko, nedu ayi
Gaf'osimiri nk'uwa;
N`echebe, nedu, nazu ayi,
 
Nani I nenyer'ayi aka;
M'o buru na Chukwu bu Nn'ayi,
Ayi nenwe ngozi nile.
 
Stanza 2
Jisus, gbaghara nmehie-ayi,
I mar'adigh-ike-ayi;
Gi bur'ayi uzo bia n'uwa,
 
I huru ahuhu-ya;
Nani Gi n'ike-ogwugwu
Gabigara nim'ohia.
 
Stanza 3
Mo Nso, si n'elu ridata,
Mejue ayi n'onu nk'igwe;
K'ihu-n'anya ju obi-ayi,
 
N'obi-uto mgbe nile.
Nchebe, ngbahara n'odudu!
M'ayi nwe ha, ayi nwe udo! Amen. 
 
Abu 209
 
Stanza 1
Nedum, Gi Jehova uku
Ony'ije n'ozara nka;
Ike adighm, Gi di ike,
 
Wer'aka-I dike jidem!
Nri nke igwe
Nazum rue mgb'afo gejum!
 
Stanza 2
Meghe is'iyi di ocha
Miri-ngwopu si eru;
K'igw'oji n'ogidi-oku
 
Dugidem n'ijem nile.
Onye-nzota,
Bur'ikem n'otam mgbe dum!
 
Stanza 3
Mgbe m'gazo ukwu na Jodan
Chupu egwu nke m'natu;
Ka m'gafe onwu n'oku-mo,
 
Rue ala Kenan n'udo.
Ab'otuto
M'gabuku I mgb'ebigh-ebi! Amen.
 
Abu 210
 
Stanza 1
Ihe oma, nedum nim'ohichi
Durum naga.
Chi ejiwo, ulo nkem di anya;
Durum naga.
Jide ukwum; Arioghm ka m'hu ihe
Di n'iiru; otu nzo-ukwu gezu.
 
Stanza 2
Adighm otu a na mbu, arioghm I, si,
Durum naga.
Iroputa n'onwem dim nma; m'ugbu a
Durum naga.
Ih'efu nk'uwa nka torom uto,
Nganga jur'obim: Echetala ha!
 
Stanza 3
Otu ike-Gi si nagozim, ya
Gedugidem,
Gafe ohia, miri, n'ozara, rue
Mgbe chi gabo.
N'ututu m'gahu ndi m'huru n'anya
Na mgbe gar'aga, ha we lanarim.
 
Stanza 4
N'uzo nkpa di warara, Gi onwe-I
Gabigara,
Jisus, durum n'okwukwe nke nwata,
Lakuru Nnam.
Ka m'zur'ike, m'ogu nk'uwa gwusia,
Nime ihe nke ndun ebigh-ebi. Amen. 
 
 
Abu 211
 
Stanza 1
Jisos, dugide
Rue mgb'ayi gezike;
Ma uzo gba ochichiri,
Ayi geso ghar'itu egwu;
Wer'aka-I dur'ayi
Rue ala nke Nn'ayi.
 
Stanza 2
Ma uzo jo njo
M'ony'iro no nso,
Ekwela k'egwu jide ayi,
Ekwel'ayi rap'olil'anya;
Site n'ahuhu
Ayi gala n'ulo.
 
Stanza 3
Mgb'ayi nacho nkasi
N'oke ihe-ngbu,
Mgb'onwunwa ohu nesogbu,
Me ka ntach'obi zue oke;
Gosi ayi ala
Eb'akwa nadigh.
 
Stanza 4
Mgb'ih'uto nk'uwa 
Puru n'anya-ayi,
Mgbe ayi si n'onwu hu igwe,
Mgb'agbaputar'ayi na nmhehie,
Si n'ulo oma-I 
Kpor'ayi nye Chuku.
 
Stanza 5
Jisos, dugide 
Rue mgb'ayi gez'ike;
Onye-ndu nk'igwe, nedu ayi
Nakasi, neyer'ayi aka;
Rue mgb'ayi geguzo
Nim'ala nke Nn'ayi. Amen
 
 
Abu 212
 
Stanza 1
“Bulie obe-i,” Jisos siri,
“Ma i nacho, k'I som n'azu;
Ju onwe-gi, rapu uwa, 
N'obi um'ala nesokwam.”
 
Stanza 2
Bulie obe-I; atul'egwu
N'aro-ya ganyigbu mo-gi;
Ike-Ya gakwagide gi,
Nye obi-i n'aka-gi ike.
 
Stanza 3
Bulie obe-i; ekwekwala
K'ihere na nganga jide i;
Onye-nwe-i buru obe, we nwua,
K'O zoput'obi-gi n'onwu.
 
Stanza 4
Bulie obe-i, wer'ike-ya
Megide ih'ize-ndu dum;
O gedu i rue ulo ka nma,
Nye g'ike k'I merie ili.
 
Stanza 5
Bulie obe-i, neso Jisos,
Nebu ya rue mgb'onwu gabia;
Nani onye nebuli'obe
Gekpu okp'eze nk'otuto.
 
 
Abu 213
 
Stanza 1
Chukwu, zim uzo-Gi,
Zim uzo-Gi!
Biko, nyerem aka,
Zim uzo-Gi!
Ka m'site n'okwukwe
Neje ije nk'oma;
Wer'ihe-Gi nedum,
Zim uzo-Gi!
 
Stanza 2
Mgbe m'nwe obi abua,
Zim uzo-Gi!
Mgbe alulu nakwu,
Zim uzo-Gi!
Mua nime igw'oji,
Nim'olu, n'ihe-ngbu;
Dozien uzom nk'oma,
Zim uzo-Gi!
 
Stanza 3
Mgbe nile m'nadi ndu,
Zim uzo-Gi!
N'ebe nile m'gano,
Ziom uzo-Gi!
Rue mgbe oso gagwu,
Rue mgbe ije gebi,
M'we kpur'okpu-eze
Zim uzo-Gi! Amen. 
 
 
Abu 214
 
Stanza 1
Jisos, nedum n'uzo ndu,
Ka m'we ghara ikpafu
Anom n'udo n'akuku-I,
Ka m'biri n'ihu-n'anya-I.
 
Chorus
Nedum, nedum,
Jisos, ka m'ghar'ikpafu;
N'ogologo ndum nile,
Onye-nwem nedum nwayo.
 
Stanza 2
Gi, Ebe-ngbaba nk'obim!
Mgb'ifufe nefes'ike,
Anom n'udo m'I no nso,
Gi bu ntukwasi-obim.
 
Stanza 3
Nedum, k'ebili-miri
Nke ndum we gabigasia;
Agameru al'ihe
Eb'anya-miri nadigh. Amen.
 
 
Abu 215
 
Stanza 1
Jis'ike! asula ngongo
M'uzo-gi gba ochichi;
Ihe di gedu ndi nwayo:
Tukwasi Chukwu obi!
 
Stanza 2
Ma uzo jo njo, di egwu,
Nsotu-ya di kwa anya,
Zonye; n'ike, n'adigh-ike,
Tukwasi Chukwu obi!
 
Stanza 3
K'Izuzu ojo la n'iyi,
N'ihe nat'ujo ihe!
Ma i nada, m'i nemeri,
Tukwasi Chukwu obi!
 
Stanza 4
Mad'ufodu gakpo i asi,
Ndi'ozo geleda i anya
Rapu ha, le anya n'elu,
Tukwasi Chukwu obi!
 
Stanza 5
Iwu nfe, n'ezi odudu,
Udo, n'ike nim'obi,
Kpakpando neny;ihe n'uzo:
Tukwasi Chukwu obi!
 
Stanza 6
Jis'ike! asula ngongo
M'uzo-gi gba ochichi;
Ihe di gedu ndi nwayo:
Tukwasi Chukwu obi! Amen. 
 
 
 
 
Abu 216
 
Stanza 1
Ka m'so Onye-nwem rida na ndagwurugwu,
Ebe miri nke mara nma neru eru;
 
M'gesogide Jisus n'eb'o bula O nedum,
Nazoso Ya rue mgbe m'gekpu okp'eze.
 
Chorus
Neso! neso! ka m'sogide Jisus!
Ebe dum O nedum ka m'ganeso Ya!
 
Neso! neso! ka m'sogiode Jisus!
Ebe nile O nedum ka m'geso Ya.
 
Stanza 2
Ka m'so Onye-nwem rida na ndagwurugwu,
Ebe miri joro njo, n'ok'ifufe di;
 
Ebe aka-Ya nedum apughm itu egwu:
Mgagh-at'ujo ih'ize-ndu m'O no nso.
 
Stanza 3
Nime ndagwurugwu m'obu n'elu ugwu,
Nkpur'obim gano nso Onye-nzotam mgbe dum;
 
O ganedum n'udo n'uzo nk'O zoro ukwu,
Rue n'ebe ha nezuko n'el'igwe-Ya. Amen. 
 
 
Abu 217
 
Stanza 1
Ngozi dir'obi ndi nahu
Ogbenye n'adigh-ike-ha;
Ha nwer'aku nke amara,
N'okpu-eze nk'onu n'igwe.
 
Stanza 2
Ngozi diri ndi'obi-ntiwa,
Ndi ner'uju n'ihi nmehie;
Obara Kraist di nso neru,
Ih'ogwugwu nk'oria-ha dum.
 
Stanza 3
Ngozi diri ndi-amara,
Nk'agu ezi'omume nagu;
Ha geri nri nke nenye ndu,
Miri nke ndu ka ha ganu.
 
Stanza 4
Ngozi diri ndi di ocha,
Ndi puru na nmeru nke njo;
Ha geji ok'onu nahu
Chineke nke dizu ocha.
 
Stanza 5
Ngozi diri ndi-ahuhu,
Ndi no na ngbu n'ihi Jisus;
Ha ganuri nimOnye-nw'ayi,
Otuto gab'ugw'olu-ha. Amen. 
 
 
Abu 218
 
Stanza 1
Mgb'ebili-miri nke ndu namaghari i,
Mgb'i neche n'ihe nile emebiwo;
Guk'otuto ngozi-gi n'otu n'otu,
Olu Chineke luru geju i anya!
 
Chorus
Guko ngozi-gi n'otu n'otu,
Guko, k'i hu olu Chineke!
Guko ngozi, kpo ha ot'otu;
Olu Chineke luru geju i anya!
 
Stanza 2
O di mgbe ibu-obi nanyigbu gi?
Ob'enyere i k'i buru, o di aro?
Guk'otutu ngozi-i, ich'uche gala,
I ganabu abu ka ubochi ra!
 
Stanza 3
Mgbe i huru aku n'ala ndi ozo,
Cheta n'ekwere i aku nk'igwe na nkwa;
Guko ngozi-i; ego apugh izuta
Ugw'olu-gi n'ulo-gi nke di n'igwe.
 
Stanza 4
Otu a n'etiti ogu nke uwa nka,
Ike agwula gi, Chineke b'eze!
Guk'otuto ngozi-i; ndi-m'ozi no nso,
Ha ganyere i aka mgb'ije gagwu. Amen. 
 
 
Abu 219
 
Stanza 1
K'uto uwa nefe,
Jisus bu nkem!
Ma m'rapu ndim n'uwa,
Jisus bu nkem!
Ohia b'ochichiri,
Iz'ik'adigh n'uwa,
Nani Kraist gagozi;
Jisus bu nkem!
 
Stanza 2
Arafula obim,
Jisus bu nkem!
Ka m'nogide n'ebe a,
Jisus bu nkem!
ihe nke bu aja,
Ihe nala n'iyi,
Sinu n'obim puta!
Jisus bu nkem!
 
Stanza 3
Lanu, nro abali:
Jisus bu nkem!
Furu mgbe chi nabo:
Jisus bu nkem!
Ih'obim nwaworo
Adigh-ejum afo,
Jisus egbowo nkpa:
Jisus bu nkem!
 
Stanza 4
Gi onwu, la ugbu a:
Jisus bu nkem!
Ndu ebigh-ebi, bia:
Jisus bu nkem!
M'gekele iz'ike,
Na ndi m'huru n'anya,
Na Onye-nzoputam:
Jisus bu nkem! Amen. 
 
 
Abu 220
 
Stanza 1
 Nwa-madu, makua nwa-nna-gi n'obi-gi!
Udo Chukwu di n'ebere di;
Ihurit'onw'ayi n'anya bu iwu-Ya;
Obu-oma bu abu n'ekpere.
 
Stanza 2
Onye Kraist huru n'anya kwuru n'ezie:-
Ikpo-isi-ala nk'O nagozi
Neke onya, weghachi' obi fur'efu,
Nazu nwa-ngbei na nwanyi di-ya nwuru.
 
Stanza 3
Were nzo-ukwu di nso so ih'atu
Nk'Onye olu-nso-Ya bu ime nma;
Otu a k'uwa nile gadi k'ulo Nn'ayi:
Ndu nk'ihu-n'anya b'abu ekele!
 
Stanza 4
Agatopu nkporo nile mgbe ahu,
Uzu-aghara nk'og'uwa gagwu;
Ihu-n'anya gazonyu oku iwe,
We kua osisi nk'udo na ntu-ya. Amen. 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 130 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.