Abụ 245-252 Ekpere
- Details
- Written by Administrator
-
Category: Uncategorised
-
Published: 07 June 2019
-
Hits: 306
Abu 245 – Ekpere b’ochicho obi,
Prayer I the soul’s sincere desire
Verse 1
Ekpere b’ochicho obi,
Nk’ekwuru, m’ob’ekwugh;
Nkpatu nk’oku zoro eze
Nke nenwu nim’obi
Verse 2
Ekpere b’ibu I’ude,
Nwusi nk’anya-miri,
Iweli-anya elu, mgbe
Nani Chukwu no nso.
Verse 3
Ekpepre bu okwu ka nfe
Nk’onu nwata nekwu;
O bu olu ka no neru
Chineke n’el’igwe.
Verse 4
Ekpere bu ike nke ndu
Nk’onye-Kraist nek’ume;
Aririo-ya n’on’uz’onwu,
O ji ya ba n’igwe.
Verse 5
Ekpere b’akwa nk’onye-njo
Narap’uz’ojo-Ya;
Ndi-m’ozi ji onu nabu,
Si, “O nekp’ekpere!”
Verse 6
Gi, Onye negos’ayi Chuku;
Uzo, Ezi’okwu,k Ndu!
I gara n’uzo ekpere:
Zi ayi ikp’ekpere!
Amen.
Abu 246 – Obim, bia nso och’ebere
Approach, my oul, the mercy eat.
Verse 1
Obim, bia nso och’ebere
Ebe Jisus naza;
Were nwayo da n’ukwu-Ya,
O gagh-achupi gi.
Verse 2
Nkwa-Gi bu nani ngopu nkem,
Okwukwe ka m’ji bia;
I nakpo obi di aro:
Otu a, Jisus, ka m’di.
Verse 3
Ibu nmehie nanyi obim,
Ekwensu nemebum;
Agha n’ezi, egwu nime,
Achorom iz’ike.
Verse 4
Buru otam, n’ebe-nzuzom,
Ka m’gbaba na ndo-Gi,
We gwa onye nekpegidem
Na Gi nwuru n’ihim.
Verse 5
Ihu-n’anya! Nwur’anwu,
Bur’obe n’ihere,
K’onye ikpe mara, dikam,
Rio n’Aha amara-I!
Amen.
Abu 247 – Obim, Jiker’aririo-I,
Come, my soul, thy suit prepare
Verse 1
Obim, Jiker’aririo-I,
Jius naza ekpere;
O bu Ya nasi gi kpe,
O gagh’akpochi nti-Ya.
Verse 2
Gi nabiakute Eze,
Bute aririo n’uba;
N’ih’amara n’ike-Ya
Mad’apugh iriobia.
Verse 3
Ibu arom ka m’ji bia;
Kraist, wepu ibu njo nka;
K’obara-I nk’awusiri
Sachapum n’ikp’omuma.
Verse 4
Achorom izu-ike;
Jisus, were nkpur’obim
Nk’I ji obara-Gi gba:
Nani I abu Eze-ya.
Verse 5
Mgbe m’bu ony’ije n’ebe a,
K’ihu-n’anya-I nyem onu;
Dika Onye-ndum n’Eyim
Nedum rue mgb’ijem gagwu.
Amen.
Abu 248
Stanza 1
Anya di nke ura natugh
N'abali o bula;
Nti di kwa nke nadigh-echi
Mgb'anyanwu dasiri.
Stanza 2
Aka di nke ikenagwugh
Mgb'ike madu gwuru;
Ihu-n'anya nadigide
Mgbe nk'uwa jur'oyi.
Stanza 3
Any'ahu nele ndi-m'ozi,
Aka nejid'igwe;
hu-n'anya nwer'och'eze,
Nti nanu abu nso.
Stanza 4
Ike di nke madu geji
Mgb'ike uwa b'efu;
O geru nti, n'anya, n'aka,
Na ihu-n'any'ahu.
Stanza 5
Ik'ahu b'ekpere; nke si
Na Kraist rue och'eze,
Neme k'aka nke Chineke
Zidata nzoputa! Amen.
Abu 249
1. Jisus bu eyi-ayi,
Nebu njo n'ahuhu-ayi!
Igwa chineke ihe dum
N'ekpere bu ok'uru!
Ayi neetuf'udo nke-uke,
Nebu, ihe-ngbu n'efu,
Nihi n'ayi agwagh Chineke
Ihe Nile n'ekpere.
2. Ayi nwere nosogbu n'onwunwa?
Ihe-nwuta di nso ayi?
K'obi-ayi ghari'ilo, miri;
Gwa Chineke n'ekpere!
Ayi gahu Eyi dika nka,
Nke nebu ihe-ngbu ayi?
Jisus maradigh-ike-ayi:
Gwa Chineke n'ekpere!
3. Ayi bu madu nenwegh ike,
Ndi ok'ibu nanyigbu?
Jisus bu ebe-ngbaba-ayi
Gwa chineke n'ekpere!
Nd'eyi-gi arapuwo gi?
Gwa Chineke n'ekpere!
O gekuru gi n'aka-ya,
I genwe nkasi-obi.
Abu 250
Stanza 1
Guzo n'etiti ayi,
Jisus, n'ike-Gi!
Ka mgbe ekpere nka
Bur'oge di nso.
Stanza 2
Kunye ume Mo Nso-I
Nim'obi nile;
Si egwu na nwuta
Pua n'obi-ayi dum.
Stanza 3
Ayi gej'ije-oku
Naga n'uzo-ayi,
Nechere nmalite
Nke mgb'ebigh-ebi. Amen.
Abu 251
Stanza 1
Jisus, zi ayi ik'ekpere
N'egwu na nsopuru;
M'ayi bu ntu n'aja n'iru Gi,
Ayi aghagh ibia nso.
Stanza 2
Mgb'ayi nekpegh ayi nala n'iyi:
Nye ayi ike ekpere!
M'ayi jikere ibiakute I,
Jisus, zut'ayi n'uzo.
Stanza 3
Nye nwuta nso n'ihi nmehie,
Nye obi um'ala,
N'ochicho sir'ike inu
Olu-Gi, we di ndu.
Stanza 4
Okwukwe n'Aja nke nani
Ya our'ikpuchi njo;
K'ayi wer'any'ayi, n'olil'any'ayi
Le nani Kraist mgbe dum.
Stanza 5
K'ayi were ntach'obi neche,
M'ebere-Gi n'odu;
Nye obi nada mb'ayi ike
Itukwasi I obi.
Stanza 6
Nye ndia, k'ewe me uche-Gi;
Site n'ike-Gi dum,
K'ayi si n'Okpara na Mo Nso
Kpere Gi k'I si cho! Amen.
Abu 252
Stanza 1
“Miri-ozuzuo nke ngozi!”
Nka bu nkwa ihu-n'anya;
Onye-nzoputa no n'elu
Gezite oge ntute.
Chorus
Ozuzo ngozi,
Ngozi ukwu di ayi nkpa;
Ebere natuwasa ayi:
Ngozi ukwu k'ayi nario.
Stanza 2
“Miri-ozuzo nke ngozi!”
Ntute-obi nke ngozi!”
Ntute-obi nke di nma;
N'ugwu na n'ebe di ala,
Uda otutu miri.
Stanza 3
“Miri-ozuzo nke ngozi!”
Jisus, k'o zokwasi ayi!
Nye ayi ntute-obi ugbu a;
Bia, sopuru okwu-Gi!
Stanza 4
“Miri-ozuzo nke ngozi!”
Me k'o zo ubochi ta,
Mgb'ayi nekwuputa nye Chukwu,
Mgbe ayi nakpoku Jisus! Amen.