The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 139 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Diocese of Ideato @20

Abu 297

Stanza 1
Kraist, Anwu nk'ezi'omume,
Ihu-n'anya Chineke,
Were ihe ututu
Mukwasi ochichi-ayi;
K'ihe-Gi chupu ngbachi
Nk'abali.

Stanza 2
Dik'igirigi nada
N'elu ih'okuku dum,
K'amara n'ike Mo-Gi
Tunye ndu nim'obi-ayi;
Ka mir'ozuzo ngozi
Zokwas'ayi.

Stanza 3
Dika oku nk'anyanwu,
K'onwunwu ihu-n'anya-I
Chupu iju-oyi-ayi,
Nye inu-oku-n'obi;
K'ayi wer'onu nefe Gi
Mgbe nile.

Stanza 4
Olil'anya n'Onye-ndu!
Arapul'ayi mgb'o bula;
Nedeb'ayi n'akuku-Gi
Rue na ndu ebigh-ebi,
Nagakur'ugwu Zaion,
B'ulo-ayi.

Stanza 5
Nedu ayi ubochi dum
N'uzo-Gi di warara;
Gafe nsogbu nk'uwa nka
We rue n'al'ahu ka nma,
Ebe ndi-Gi nez'ike
Na ngozi. Amen. 


Abu 298

Stanza 1
Biakutem, Kraist, mgbe m'tetara,
Mgbe anw'ututu nawata;
K'ezie'echiche batam n'isi
Dik'igirigi si n'igwe.

Stanza 2
Biakutem n'oke ehihie,
Ka nsogbu nile di n'uwa
Ghar'ikpuchi ihe iru-Gi,
We me k'ubochim gbachita.

Stanza 3
Biakutem na mgbe anyasi;
Asi na obim kpafuru,
Kpolata ya na, ma mukwasim
Iru-oma-I ka kpakpando.

Stanza 4
Biakutem nime abali
Mgbe ura gefepu n'anyam;
Ka nkpur'obim huiz'ike,
Ka Jon si hu, n'obi Jisus.

Stanza 5
Biakutem n'uzo ndu nile;
Mgbe obim kubiri ume,
Ka m'lakuru I, Onye-nzotam,
Ka nwa-I nonyere Gi n'igwe. Amen. 


Abu 299

Stanza 1
Obim, teta, so anyanwu
Je ozi-gi nk'ubochi ta;
Rap'ume-ngwu, bilie n'onu,
Kpe ekpere ututu-gi.

Stanza 2
Teta, obim, welie onwe-i
Soro ndi-m'ozi n'olu-ha:
Ndi nabu abu n'abali,
Neto Eze ebigh-ebi.

Stanza 3
Nekwu ezi'okwu mgbe nile,
K'ako-n'uche-gi di ocha;
Anya Chineke nahuzu
Ihe-nzuzo dum nke ndu-gi.

Stanza 4
Ka m' to Gi, Onye cheberem
We tute ndum mgbe m'no n'ura;
Kwe, mgbe m'gesi n'onwu bilie,
Ka m'keta ndu ebigh-ebi.

Stanza 5
Biko, nedum n'ubochi ta,
N'okwu, n'uche, n'omume nkem;
Ka ike nile di nimem
Jiko n'otu n'ito nani I.

Stanza 6
To Chineke, Onye-ngozi;
To Ya, ihe nile n'uwa;
To Ya, usu nile nk'igwe;
To Nna, n'Okpara, na Mo Nso.

Abu 300

Stanza 1
Chukwum, o di mgbe di uto
Si n'ututu rue anyasi,
Dika nka, nakpom bia n'ukwu-I:
Mgbe ekpere?

Stanza 2
Ngozi diri mgb'ututu nka,
Ngozi diri mgbe anyasi,
Mgbe m'ji nku ekpere felie,
We rap'uwa.

Stanza 3
Mgb'ahu ihe nenwukwasim
Nke kariri anw'ututu;
Ngozi-Gi, nke nabugh nk'uwa,
Nadakwasim.

Stanza 4
Mgb'ahu I nenyem ik'ohu,
Mgb'ahub I nagbahara njom,
We wer'olil'anya nk'igwe
Kasiem obi.

Stanza 5
O digh onu puru ikwu
K'I si negbo nkpam n'eb'ahu;
Ike n'ogu, ogwu nauta,
Udo nk'obi.

Stanza 6
Ich'uch'agwu! ujo ala!
Obim di k'o no n'el'igwe;
Ehichapur'anya-miri
Nke akwa-njo.

Stanza 7
Nna, rue mgbe m'geru al'onu,
O digh ihe gatom uto,
Dik'irupuru Gi obim
Nim'ekpere. Amen.

Abu 301

Stanza 1
Ugbu ak'anyanwu putara,
Ayi nenye Chukwu obi-ayi,
K'O gbopur'ayi ih'ojo ta,
Nim'okwu n'omume-ayi dum.

Stanza 2
Chukwu, nejide ire-ayi,
Wepu onuma na ndu-ayi;
Wezug'any'ayi n'ih'ojo dum,
Ekwela k'ayi nu ih'efu.

Stanza 3
K'ako-n'uche-ayi di ocha,
K'ayi char'ich'echiche nzuzu;
K'ayi were ijide-onw'ayi
Merie nganga n'agu-nmehie.

Stanza 4
Ka mgbe ubochi nka gagwu,
Ochichiri we laghachi,
Ayi gej'obi nenwegh ntupo
Neto Chukwu n'ihi nmeri.

Stanza 5
Otuto diri Chukwu Nna,
Na Gi Okpar'ebigh-ebi,
Nyere Mo Nso, Ony'ayi neto,
Rue mgbe nile ebigh-ebi. Amen.

Abu 302

Stanza 1
Bia n'ekper'ututu,
Bia k'ayi gbue ikpere;
Ekpere b'ike ony'ije
Ji eso Chineke.

Stanza 2
N'ehihie, zur'ike
N'okpuru Nkume-ayi;
Ndo-Ya bu ihe di uto
Mgbe anyanwu nacha.

Stanza 3
N'anyasi, mechi'uzo,
Kpe nime ulo-Gi;
I gahu n'o bulo Chukwu,
On'uzo el'igwe. Amen.


Abu 303

Stanza 1
Onye-nwem, ka m'je n'Aha-Gi
Ilu onu nk'ubochi ta;
Gi, nani Gi ka m'gamara
N'echichem, n'okum, n'omumem.

Stanza 2
Olu nk'amara-Gi nyerem
Ka m'were onu luzue ya;
Nachota iru-I nime ya;
Nanwaputa uche nso-Gi.

Stanza 3
Gi ka ngedebe n'aka nrim,
Anya-Gi nahu im'obim;
Ka m'nalu k'iwu-Gi si di,
Che olum nile n'iru Gi.

Stanza 4
Ka m'buru ibu-Gi di nfe,
Neche nche, nekpe mgbe nile;
Nele anya ihe nk'igwe.
Nagbaso uboch'otuto-I.

Stanza 5
Ka m'wer'onu nar'ihe dum
Nk'uju amara-Gi nyerem;
Wer'obi uto nagba osom,
Nejeso Gi ba n'el'igwe. Amen.

Abu 304

Stanza 1
Kraist, n'ukwu-I k'ayi dobara
Onyinye-I nk'ubochi ta;
Namagh ih'o geweta
Ayi nar'o iny'aka-Gi;
K'o ghar'ibu mgbe iyi,
Jisus wer'obe-I ka ya.

Stanza 2
M'ubochi di nma, di ju,
Gi bur'isi-onu-ayi;
M'o weta ihe-nwuta,
Ngozi-Gi bu nani nma;
Ayi nario I, n'isi-mbu-ya,
Jisus, wer'obe-I ka ya.

Stanza 3
Ayi mar'adigh-ike-ayi,
Nahu nd'iro-ayi nwanti;
Ih'ize-ndu-ayi nile
Putar'ihe n'iru Gi;
Ajul'ayi mgbe ayi nario
Omiko-Gi na nkpa-ayi.

Stanza 4
Ayi chor'imaku okwu-I,
Nadi ndu n'amara-Gi;
Were onwe-ayi nye Gi,
Neme k'uche-Gi sic ho;
Neche, nekwu, neme kaw,
Nani ihe nato Gi.

Stanza 5
Onye-nw'ayi, nur'olu-ayi,
K'ihu-n'anya-Gi nye ayi
Onyinye-I nke kachasi:
Ezi ntukwasi-obi;
Otu a k'ubochi-ayi dum
Gegosi otuto-Gi. Amen.

Abu 305

Stanza 1
Nteta n'ututu negosi
Ihu-n'anya-Gi kw'ubochi;
Ayi si n'ura n'ochichiri
Puta na ndu n'ike ohu.

Stanza 2

Ebere ohu kw'ubochi
Nabiakut'ayi n'og'ekpere:
Nzota na ngbahara ohu,
Ecihe ohu nke Chukwu.

Stanza 3
Ma echiche-ayi kw'ubochi
Nedo ihe ayi huru nso,
Aku ohu di ok'onu
hukwu genye dik'ih'aja.

Stanza 4
Olu nke ubochi nile
Geny'ihe kwesiri k'ayi rio:-
Efe iju onw'ayi, uzo
Gewet'ayi nso Chukwu kari.

Stanza 5
Nani, Nn'ayi, n'ihu-n'anya-Gi,
Jiker'ayi iz'ike n'elu;
Nyer'ayi aka, ubochi dum,
Idi ndu k'ekper'ayi si di. Amen.

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 173 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.