Abụ 318-323 Onyinye
- Details
- Written by Administrator
-
Category: Uncategorised
-
Published: 07 June 2019
-
Hits: 298
Abu 318
Stanza 1
Buanu, ndi ji ekele,
Abu nk'owuw'ih'ubi;
Ayi nekpokobata nri
Tutu uguru abia.
Chukwu-Okike nenye
Ihe nile di ayi nkpa;
Bianu n'ulo Chineke,
Bulie abu nk'owukwe.
Stanza 2
Uwa dum b'ubi Chukwu,
K'o mia nkpuru nk'otuto;
Anagh oka n'ata
K'onu na ngbu we puta.
Ihe-npute, n'uzari,
N'ezi oko n'ikp'azu;
Chukwu nk'owuwe-nri, kwe
K'ayi bur'oka char'acha.
Stanza 3
Chukwu, onye-nw'ayi, gabia
were owuwe-Ya la,
Si n'ubi-Ya kpochapu
Njo nile n'ubochi'ahu;
Nye ndi-m'ozi-Ya iwu
Ka ha rechapu ata,
Tite kwa ezi oka
N'ulo-Ya ebigh-ebi.
Stanza 4
Onye-nw'ayi, biko, bia ngwa
Wer'owuwe-I ikp'azu,
Kpokobata ndi nke-Gi
Si na ngbu na njo puta:
Ndi anuchara n'obi
Ka ha biri n'ulo-Gi;
Were ndi-m'ozi-Gi bia,
Bulie owuw'otuto! Amen.
Abu 319
Stanza 1
Ayi nasu ala ubi,
Ko ji oma na ya,
Ma Chukwu ji aka-Ya
Nemeka ha neto.
O nyere mir'ozuzo
K'ome-ji we pute;
Anyanwu n'igirigi,
Nenye ayi nri n'uba.
Chorus
Onyiny'oma nila
Ha dum si n'elu bia;
Kele Chukwu, kele Chukwu
N'ihu-n'anya-Ya!
Stanza 2
O bu nani Ya kere
Ihe nile n'uwa:
Okoko neto n'ohia,
Kpakpando nk'anyasi.
Ifufe nan'olu-Ya,
Ya nenye nnunu nri;
Nke ka, O neny'umu-Ya
Nri-ha kwa-ubochi.
Stanza 3
Nna, ayi nenye I ekele
N'ihi ih'oma dum:
Mgb'igha-nkpuru n'owuwe,
Ndu, nri, n'aru-ike.
Nar'onyinye ayi chere
N'ih'ihu-n'anya-Gi;
N'ihe nato Gi kari:
Obi-ekele-ayi. Amen.
Abu 320
Stanza 1
Chineke nk'el'igwe n'ala,
Otuto nile diri Gi!
Ayi gesi ana kele Gi,
Ony'onyinye?
Stanza 2
Anwu, na miri, n'ikuku,
Negosi ihu-n'anya-Gi;
I no n'owuwe-ih'ubi,
Ony'onyinye!
Stanza 3
N'ihi udo n'aru-ike,
N'ihi ngozi nile nk'uwa,
Ekele n'otuto diri I,
Ony'onyinye!
Stanza 4
I zodogh nani otu Nwa-I
M'I nyere Ya n'ihi uwa
We sor'Onye ngozi ahu
Nye ihe dum.
Stanza 5
Gi nenye onyinye Mo Nso:
Mo ndu, n'ike, n'ihu-n'anya,
We zokwasi amara Ya
N'elu ayi dum.
Stanza 6
N'ihi ndi agbaputara,
N'ihi olil'anya igwe,
Otuto nile diri Gi,
Ony'onyinye!
Stanza 7
Icho nani nk'ayi bu iyi!
O bu aku gadi mgbe dum:-
Ih'obula ayi genye Gi,
Ony'onyinye!
Stanza 8
Nna, ayi binye I ih'o bula
I gakwu ayi ugwo nk'ukwu;
Ayi geji obi uto nye Gi,
Ony'onyinye!
Stanza 9
Gi, Onye ayi nesi n'aka I
Nwe ndu ayi n'oninye nile,
K'ayi binyere I ebigh ebi,
Ony'onyinye! Amen.
Abu 321
Stanza 1
Ayi nekele Gi, Onye nw'ayi!
Nkwa-Gi ochie adigh ada;
Udumiri sor'okochi,
Nenye ayi ih'oma kw'aro.
Ayi nekele I ubochi ta:
K'obi-ayi jiker'onwe ha!
Stanza 2
Mgbe oyi uguru natu,
Mgb'anwu okochi namagbu,
Mgbe ifufe nefes'ike,
Mgb'udumiri need ala:
Ayi ganabu nye Gi, Ez'ayi!
Nime ngbanwe ndia I nachi!
Stanza 3
Nke ka ukwu, mgbe aka-Gi
Nyere ayi nri ohu n'uba;
Mgb'olu abu di n'ebe dum,
Mgbe ayi nebulat'ih'ubi:
Ayi geweli ab'otuto:
Ayi dum neketa ngozi-Gi.
Stanza 4
Chukwu, ihe nile bu nke-I:
Miri nezo, n'anwu namu,
Nkpuru ezoro nim'ala,
Nka mere k'o nami n'uba.
Kw'aro onyinye-I naputa;
Onu-ayi ganeto I ohi! Amen.
Abu 322
Stanza 1
Ayi nenye I ihe-Gi;
Onyinye o bula;
Ihe dum ayi nwere bu nke-I,
Iji lua olu-Gi.
Stanza 2
K'ayi nara ngozi-Gi
Dik'ezi ndi-oru;
K'ayi wer'onu nyeghachi Gi
Nkpuru-mbu nk'I nyere.
Stanza 3
Obi di nke nwuru,
Ulo togbo n'efu,
N'aturu Jisus nwururu
Nefughari n'uwa!
Stanza 4
Ikasi, n'igozi,
Ich'ogwu ahuhu,
Ilekota ndi-ogbenye:
B'olu m'ozi n'uwa!
Stanza 5
Itopu ndi-nmehie,
I cho ndi fur'efu,
Izi uzo nke ndu n'udo:
Bu ime dika Kraist!
Stanza 6
Ayi kwere okwu-Gi,
N'okwukwe-ayi di nta:
Ih'ayi mere ndi nke-Gi, Kraist,
Ayi mere ha nye Gi! Amen.
Abu 323
Stanza 1
K'ayi kele Nn'ayi ugbu a,
Newer'obi n'olu-ayi;
Nke nalu ok'olu,
Neme k'uwa-Ya nuria;
Onye j'ihu-n'any
Nagozi ayi mgbe dum
Site n'aka nn-ayi;
O bu kwa nk'ayi ugbu a.
Stanza 2
Ka Chukwu omanka
Nano nso ayi mgbe nile,
Natute obi-ayi
N'onu n'udo di ngozi;
Deb'ayi n'amara-Ya,
Gbochier'ayi obi'abua
Me k'ayi pua na njo dum
N'uwa nka na nk'ozo.
Stanza 3
Otuto n'ekele
Bu nke-Gi, Chineke, Nna,
N'Okpara na Mo Nso,
N'ebe kachasi elu:
Chinek'ebigh-ebi,
Nk'ihe nile neto:
O diri, di kw'ugbu a,
Gadigide mgbe dum. Amen.