The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 251 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Abu 324

Stanza 1
Aro ole-n'ole
Gabia we gabiga,
Ayi gesoro ndi nez'ike
Rar'ura nim'ili.

Chorus
Onye-nwem, dozi'obim
N'ihi uboch'ahu;
Were obara-Gi sachem,
We hichapu nmehiem.

Stanza 2
Anwu ole- n'ole
Gada n'ugwu nk'uwa,
Ayi gano n'uwa nke ka nma,
Ebe anwu nadigh.

Stanza 3
Ifuf'ole-n'ole
Gefegid'ayi n'ebe a,
Ayi gano n'ebe ndaju di,
N'udo rue mgbe nile.

Stanza 4
Igba-ngba na nkewa
Ole-n'ole gadi;
Anya-miri ole-n'ole,
N'akwa adigh ozo.

Stanza 5
O foduru Mgbe O gania ozo;
O nwuru n'ihi ayi, di ndu
K'ayi soro Ya b'Eze. Amen.


Abu 325

Stanza 1
N'ih'ebere-I amara-I
N'aro gafere ugbu a,
Nuru abu ekele,
Jisus, Onye-ngbaput'ayi.

Stanza 2
Ayi amagh odi-n'iru:
Dur'ayi, Kpakpand'ututu;
Agha na nd'iro d'ike:
Jisus, lu-kwa-r'ayi ogu.

Stanza 3
N'ahuhu n'adigh-ike
Buru Nkume d'ike-ayi;
Nime nfughari nk'uwa
Bir'ezi Uzo ndu-ayi.

Stanza 4
Onye gagbaso uizo
Nk'onwu nime aro nka,
Ka ndele na nkpa-n'aka-I
Nenye ya nkasi-obi.

Stanza 5
K'ayi di ocha, zueoke,
K'ayi buru nke-Gi mgbe dum;
Nyer'ayi aka k'ayi kwesi
Inata okpu-eze. Amen.


Abu 326

Stanza 1
nime ngbanwe nile nke dum,
Nim'ahuhu n'onu,
Agameji irem n'obim
Neto Chineke nkem.

Stanza 2
Som me ka Chukwu di ukwu,
Som neto aha-Ya;
Mgbe m'lpokuru Ya n'ahuhu
O biara zoputam.

Stanza 3
Ndi-agha Chineke niche
Ulo ndi oma-Ya;
Ndi natukwasi Ya obi
K'O neneye ngbaputa.

Stanza 4
Biko, nwa ihu-n'anya-Ya:
I gamata nk'oma
Na nani ndi kwere na Ya
Bu ndi agoziri.

Stanza 5
Ndi-nso, m'unu tua egwu-Ya:
Egwu ozo adigh;
K'ozi-Ya nato un'uto:
O gegbo nkpa-unu.

Stanza 6
Nna, na Okpara, na Mo Nso,
Ony'ayi nasopuru,
Ka otuto diri ugbu a
We rue mgb'ebigh-ebi. Amen.


Abu 327

Stanza 1
Mgbe nkem di n'aka-Gi:
Otu a ka o si tom;
Ndum, ndi-enyim, na nkpur'obim,
Ka m'ara nye n'aka-I.

Stanza 2
Mgbe nkem di n'aka-Gi,
Ih'o bula ha bu:
Ngbu n'onu, ochichi n'ihe,
Otu o si to Gi.

Stanza 3
Mgbe nkem di n'aka-Gi,
Agaghm-atu egwu:
Nna apugh ime nwa nke-Ya
K'o kwa akwa n'efu.

Stanza 4
Mgbe nkem di n'aka-Gi;
Jisus akpogburu:
Aka nke nmehiem kpopuru
Bu onye-ndum ugbu a.

Stanza 5
Mgbe nkem di n'aka-Gi:
Ka m'tukwasi I obim;
Onwu gasia, n'aka-nri-Gi
Ka m'gano mgbe nile. Amen.

Abu 328

Stanza 1
Chineke, Nna, kwe ka m'do
Aro nka nso nye I,
Nim'onodu o bula
I genyem n'uwa:
Ipu n'ahuhu na nkpa
Abugh oke nkem;
Wkperem bu nani nka:
K'eto Aha-Gi!

Stanza 2
Nwa garioro onwe-ya
Ndu nke o gadi?
Ihu-n'anya Nna gaju
Inye ih'oma?
Gi nenye ayi kw'ubochi
Kari nk'ayi rioro;
I napugh ih'o bula
Geto Aha-Gi!

Stanza 3
O buru kwa n'ebere
Gi genyem onu;
O buru n'iru-oma-I
Gamukwasindum;
K'obimnim'abu onu,
Kwuput'aha-Gi;
Ka ih'echi geweta
Tobe Aha-Gi!

Stanza 4
M'I kpom ka m'buru obe,
Ihe-ngbu-ya bia,
Uru, we gho ih'ayi,
Onwu nogidem:
Kwe ka m'chetaotu Nwa-I
Nara otuto;
Ka n'nekpe nim'ahuhu:
K'eto Aha-Gi! Amen.

Abu 329

Stanza 1
Nn'ayi, gozie ar'ohu nka
Nye ndi nile no n'ebe a;
Nye okwu-I ike di nso
K'ayi kwere ibu ndi-Gi.

Stanza 2
Onye-nche aturu Gi,
K'obi-etili kwa njo;
Me ka nd'isi nan'uzo
We le nani Gi anya.

Stanza 3
Olu nk'I malitere
Nye ike ohu n'oso;
Chupu ochichi n'egwu,
Hichapu anya-miri.

Stanza 4
Gozie nwata n'okenye,
K'onu nileneto Gi;
Ka nzuko nka nwaputa
Ike-I na ihu-n'anya-I. Amen.


Abu 330

Stanza 1
Ar'ohu namalite;
Onye-nw'ayi, k'o buru,
N'olu m'obu n'iche-nche,
Aro nke diri Gi.

Stanza 2
Aro ntukwasi-obi,
Nk'ebere n'amara;
Ar'ohu nk'ezi onu
Nk'iru-I gamukwasi.

Stanza 3
Aro nke iga- n'iru,
Aro nke otuto;
Ar'ohu nke nnwaputa
Nnonyere-Gi mgbe dum.

Stanza 4
Aro nke ije-ozi,
N'ama ihu-n'anya-I;
Ar'ohu nke njikere
Ilu olu n'igwe.

Stanza 5
Ar'ohu namalite:
Onye-nw-ayi,k'o buru,
Nim'uwa m'obu n'igwe,
Aro nke diri Gi. Amen.

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 58 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.