The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 313 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Abu 337

Stanza 1
Kraist bu Nto-ala-ayi,
Ayi newu n'elu Ya;
Nani ndi nso nke-Ya
Neju ulo nk'igwe;
O nenye ayi olil'anya
Nk'ike n'uwa, n'onu n'elu.

Stanza 2
K'abu nke otuto
Nada n'ulo nso nka;
Ayi geweli olu
To Ato nim'otu;
Wer'abu onu nekwusa
Aha otuto-Ya mgbe dum.

Stanza 3
N'ebe a, Nna nk'amara,
Nabia nso ayi mgbe dum;
Nara nkwa nso nile,
Nuru aririo-ayi;
Were ngozi wukwasi ndi
No n'ekpere n'ubochi nso.

Stanza 4
N'ebe a k'ayi nariota
Amara si n'igwe;
Kwe k'amara ahu
Diyer'ayi mgbe nile;
We rue mgbe ndi-ngozi nile
Gala n'igwe, we zue ike. Amen.

Abu 338

Stanza 1
Chineke, ayi nahu
Ebe nso nka n'anya;
Onu nke Ulo-Gi
Ka onu dum nk'uwa.

Stanza 2
O b'ulo ekpere
Ebe ayi nezuko;
Gi, Nna, no kwa n'ebe a
Ikele ndi nke-Gi.

Stanza 3
Ihe-ime-baptism
Nato, ebe Mo Nso
Nawusa mgbe nile
Ngozi so n'el'igwe.

Stanza 4
Okwu ndu nato ayi,
Nke kwuwara udo,
Nkasi nime ogu,
N'onu ebigh-ebi.

Stanza 5
Oriri-I,Onye-nw'ayi,
Nato ayi, ebe Gi,
Onye bu Nri nke ndu,
Nenye umu-Gi nri.

Stanza 6
N'uwa o nato ayi
Ito ebere-Gi;
Man ayi nachos'ike
Ibu abu nk'igwe.

Stanza 7
Jisus, nye amara
K'ayi hu I n'anya n'uwa,
Hu iru-Gi n'igwe,
So ndi nso-Gi neto. Amen.

Abu 339

Stanza 1
Ezi'Onye-nche ndi-Gi, nuru,
Gosi iru-I ugbu a;
I nyere ulo ekpere;
Nye ayi obi nekpe.

Stanza 2
Nim'ulo nka k'ihu-n'anya
N'olil'anya nebi;
Nye ako-n'uche iz'ike,
Gw'onya nkpur'obi-ayi.

Stanza 3
K'ayi wer'okwukwe nar'okwu-I,
Nekpe nim'okwukwe;
We buru nkpa nile togbo
N'iru Gi, Onye-nw'ayi.

Stanza 4
Nye nti nanu, n'anya nahu,
N'obi ume-ala;
Si n'elu musa ihe-Gi,
K'ayi neto n'amara. Amen.


Abu 340

Stanza 1
Kraist bu Nto-ala di ike,
Kraist, Isi Nkume-nkuku
Nke Chineke roputara,
Nejiko Nzuko mgbe nile,
Na ntukwasi-obi-ya.

Stanza 2
N'ulo eb'ayi nakpo Gi,
Chukwu, bia n'ubochi ta;
Were kwa obi-oma-Gi
Nuru aririo ndi nke-I;
Wusa ngozi-Gi zur'oke
Nim aja-ya mgbe nile.

Stanza 3
N'ebe a nye ndi-oru-Gi dum
Aririo nke ha nario,
Ka ha soro ndi-ngozi-Gi
Jid'ihe ha riotara;
So kwa Gi nime otuto,
Bur'eze mgb'ebih-ebi.

Stanza Otuto, nsopuru nile
Diri Chineke, bu Nna,
Di-kwa-r'Okpara na Mo Nso,
Ato nim'otu mgbe dum,
Onye d'ike nim'otuto
Rue n'uwa ebigh-ebi! Amen.

Abu 341

Stanza 1
Nna nk'amara, nonyer'ayi ta;
Ulo nka k'ayi nedo nso nye I;
Biko, Nna, to nti-Gi n'a la
Nur'olu ekpere ndi-Gi.

Stanza 2
K'udo nso nebi nime ya,
N'ihu-n'anya, n'ezi-okwu;
K'obi di aro nwe nkasi
N'amara-Gi di ok'onu.

Stanza 3
K'anu olu ony'aririo,
K'ony'ike gwuru zur'ike;
K'onye nakwa njo Gi,
Ndi nechere I nata ngozi.

Stanza 4
Mgb'ananu ozi'oma n'ebe a,
Mgb'anekwusa Aha-nzota,
K'atute obi nwur'anwu,
O we di ndu, nenwu k'oku.

Stanza 5
Ka ndi dara ogbi nabu,
Ndi nti chiri nanu ihe;
Nye ndi di um'ala n'obi
Ngbahara n'onodu egwu.

Stanza 6
Nna, me k'ulo nka buru nke-I,
K'achota ru-Gi n'ebe a;
K'o bur'ul nke Chineke,
On'uzo el'igwe n'ezie. Amen.

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 89 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.