Abụ 400 Abụ Nke Ndi Niger Diocese Women's Guild
- Details
- Written by Administrator
-
Category: Uncategorised
-
Published: 07 June 2019
-
Hits: 757
Abu 400
Stanza 1
Chineke, ayi nario Gi K'I nye ndi-otu-ayi
ngozi;
Do ndu-ayi nile nso, mejue obi-ayi n'ihu-n'anya,
K'ayi buru ndi nwunye, ndikwesiri ntukwas'obi:
Chineke, ayi nario Gi k'I nonyere ndi-otu-ayi.
Stanza 2
Mgbe ayi nagu Okwu Nso-Gi nye ayi amam ihe-Gi;
Me k'ayi nahu ulo nso-Gi n'oge ekpere n'anya;
Jiker'obi-ayi k'ayi we ba n'al'eze el'igwe-Gi:
Chineke, ayi nario Gi k'I nonyere ndi-otu-ayi.
Stanza 3
Chineke, ayi nario Gi k'I nye ndi-otu-ayi Mo Nso,
K'ayi buru ndi-ezi-okwu n'omume-ayi n'okwu-ayi;
K'ayi nazu umu I nyere ayi n'uzo nile nke-Gi:
Chineke, ayi nario Gi k'I nonyere ndi-otu-ayi.
Stanza 4
Me k'ayi buru ndi-oku nakutara Jisus madu;
Nyer'ayi akaigba nd'oria na ndi ner'uju ume;
Ekwela k'okwukwe-ayi na ihu-n'any'ayi ju oyi;
Chineke ayi nario Gi k'I nye ndi-otu-ay ngozi. Amen.