Abụ 42-50 Mbilite N'Ọnwụ Jisọs
- Details
- Written by Administrator
-
Category: Uncategorised
-
Published: 05 June 2019
-
Hits: 1155
Abu 42
Stanza 1
Kraist Ez'ayi biliri ta:
Haleluya!
Ka madu na m'ozi si:
Haleluya!
Kwesienu abu ike:
Haleluya!
Igwe na ala, kwenu.
Haleluya!
Stanza 2
O lusiwo olu-Ya;
Haleluya!
O luwo ogu, merie;
Haleluya!
Anwu nk'ezi-omume;
Haleluya!
O gagh-anwu kwa ozo.
Haleluya!
Stanza 3
Ndi-nche neche nche n'efu;
Haleluya!
Kraist etiw'uzo ili;
Haleluya!
Onwu ejidegh kwa Ya!
Haleluya!
Kraist emeghewo igwe.
Haleluya!
Stanza 4
Eze-ayi di ndu ozo;
Haleluya!
Onwu, ole ike-gi?
Haleluya!
O nwuru, k'ayi we di ndu;
Haleluya!
IIi, ole nmeri-gi?
Haleluya!
Stanza 5
K'ayi rigokuru Ez'ayi,
Haleluya!
Neso Ya, bu Isi-ayi;
Haleluya!
Ayi geyi Ya, we bilie;
Haleluya!
Nadi ndu nmeri nk'obe.
Haleluya!
Stanza 6
To Eze igwe n'uwa,
Haleluya!
K'ihe nile neto Gi;
Haleluya!
Onye-nmeri, ayi neto I,
Haleluya!
To Gi, Nbilite-n'onwu.
Haleluya! Amen.
Abu 43
Stanza 1
Ta Ka Jisus biliri, Haleluya!
Ya mere ayi nan'onu Haleluya!
O nwuru n'elu obe, Haleluya!
K'O we gbaput'ayi n'oru. Haleluya!
Stanza 2
K'ayi wer'abu tobe Ya, Haleluya!
To Kraist Eze nke igwe; Haleluya!
O nagider'onw'obe, Haleluya!
K'O zoputa ndi-nmehie. Haleluya!
Stanza 3
Nhuj'anya O hujuru, Haleluya!
Ka O ji natar'ayi ndu; Haleluya!
O b'Eze n'igwe ugbu a, Haleluya!
Ebe ndi-m'ozi nabu Haleluya!
Stanza 4
To Okpara biliri; Haleluya!
To Nna-Ya, bu Chineke; Haleluya!
To Mo Nso nke di ngozi; Haleluya!
K'ora nile naza, si. Haleluya!
Abu 44
Stanza 1
Haleluya! Haleluya! Haleluya!
Okwu agwu; ogu ebie:
Jisus emeriwo onwu;
Bubanu abu ok'onu:
Haleluya!
Stanza 2
Onwu mere k'ike-ya ra,
Ma Kraist lugburu ya n'ogu;
K'ayi tisie nkpu onu ike:
Haleluya!
Stanza 3
Uboch'ato gabigara,
O si n'onwu bilie, din du;
Otuto nile diri Kraist!
Haleluya!
Stanza 4
O kujiri nkporo onwu;
O kwaghe uzo el'igwe;
K'ayi buara Ya abu nmeri:
Haleluya!
Stanza 5
Jisus, site n'onwu nke-Gi,
Zoputa ayi n'egwu onwu,
K'ayi di ndu, nabuku I abu:
Haleluya!
Abu 45
Stanza 1
Jisus di ndu! gi, onwu,
I pugh ime k'ayi tua egwu;
Jisus di ndu! gi ill,
I pugh ime k'ayi bur'oru.
Haleluya!
Stanza 2
Jisus di ndu! rue ugbu a
Onwu bu on'uzo nke ndu;
Nka gewepu egwu-ayi
Mgb'ayi gagabiga uzo-ya.
Haleluya!
Stanza 3
Jisus di ndu! O nwur'ayi:
K'ayi diri nani Jisus ndu;
K'ayi biri n'obi ocha,
Neto Onye-nzoputa-ayi.
Haleluya!
Stanza 4
Jisus di ndu! ayi mara
O digh ihe gekewp'ayi;
Ndu, Onwu na Ekwensu,
H'apugh inap'ayi n'aka -Ya.
Haleluya!
Stanza 5
Jisus di ndu! ewere
Oche-eze nile nye Ya;
Ayi pur'iru eb'O no,
So Ya buru eze n'igwe.
Haleluya! Amen.
Abu 46
Stanza 1
“Utu'on'ekele!” ogbo nile si;
Emeriwo onwu, emegh'igwe ta.
Onye nwuru di ndu, Ez'ebigh-ebi!
Ihe dum ekere to Ony'okike!
Chorus
“Utut'on'ekele! “ogbo nile si;
Emeriwo onwu, emegh'igwe ta.
Stanza 2
Uwa, nekwuputa olu Eze-ayi,
Na onyiny'oma nile O nyere ayi;
Ohia na ozara nekwuputa, si
N'ahuhu-ya ebie, O meriw'onwu.
Stanza 3
Onye-ngbaputa-ayi, Onye nenye ndu,
Gi si n'igwe leta madu dar'ada;
Otu Okpara-Nna, Onye b'Ez'okwu,
Onye ghoro madu k'O we zoput'ayi.
Stanza 4
Gi, Onye b'isi-ndu, I nwu-kwa-r'anwu,
Zor'uz'ochichiri, gosi kwa ike;
Bia, Gi Ezi-okwu, mezue okwu-Gi;
Ta b'ubochi ato-I; bilie, Onye-nwe'ayi!
Stanza 5
Topu obi ndi Ekwensu ker'agbu;
Ndi nile dar'ada nye ha ndu ohu!
Gos'iru-oma-Gi, ka mba nile hu;
Weghachi kwa ihe: ihe nk'okwu-Gi. Amen.
Abu 47
Stanza 1
Haleluya, O biliwo!
Jisus arigo n'elu!
Tikpo kwa ike nke onwu;
M'ozi buanu, madu za:
O biliwo, O biliwo,
Di ndu, O pugh inw'ozo.
Stanza 2
Haleluya, O biliwo!
Onye-isi-ayi ukwu
Zite Mo Nso, Onye-ama,
Bu Onu-nekwuru-ayi.
O biliwo, O biliwwo!
Ikpe amagh ayi ozo.
Stanza
Haleluya, O biliwo!
Onwu enwegh ik'ozo;
Kraist, bu kwa Nbilite-n'onwu,
Gakpote ndi-Ya n'ili.
O biliwo, O biliwo,
O di ndu, Eze nabia. Amen.
Abu 48
Stanza 1
Haleluya! Haleluya!
K'obi n'olu-ayi neto,
Nabuku Chukwu ab'onu,
Nabu abu otuto.
Onye nwuru n'elu obe
N'ihi nzoputa nke-ayi,
Jisus Kraist, Eze otuto,
Si n'onwu bilie ozo.
Stanza 2
Ugbu a etiwawo ili,
Kraist si n'onwu ban a ndu,
Ndu ebube nk'ebigh-ebi,
N'ututu ubochi ta;
Ayi gesoro Kraist we meri,
Site na ike nke-Ya;
So Ya ban a nd'ebigh-ebi,
Site na Nbilite-Ya.
Stanza 3
Kraist, Onye bu Nkpuru nke mbu
Mus'ayi amara nk'igwe,
Ihu-n'anya ika ihe
Si n'iru Ya nenwupu:
K'ayi d'obi-ayi n'elu igwe,
Namiri Gi nkpur-oma,
Nke genye Gi otuto rue
Mgbe ayi gahu iru-Gi.
Stanza 4
Haleluya! Haleluya!
Otuto diri Chukwu,
Diri Nna, n'Onye-nzoputa
Kraist, bu Onye nwe nmeri;
Otuto di-kwa-ra Mo Nso,
Is'iyi nk'ihu-n'anya;
Haleluya! Haleluya!
Diri Ato nim'Otu. Amen.
Abu 49
Stanza 1
Eme nkwa ekwere,
Olu nzoput'agwu;
Ikpe n'ebere di n'otu,
Nna, akpote Nwa-Ya.
Stanza 2
Obim, tobe Jisus,
Onye kpogburu njo-i;
Onye nwur'anwu di kwa ndu,
O gagh'anwu ozo.
Stanza 3
Onwu-Ya g'enye i ndu,
Nbilite-Ya bu nke-i;
Kwe Chineke gasacha i
Nim'obara Jisus. Amen.
Abu 50
Stanza 1
O togboro n'ili-
Onye-nzoputam!
Nech'ubochi ahu-
Jisus Ezem!
Chorus
O siwo n'ili bilie,
O meriwo ndi-iro-Ya;
Onye-nmeri nke ike ochichiri,
Ya na ndi nso-Ya gachi ebigh-ebi;
O bilie, O bilie,
Haleluya! O bilie!
Stanza 2
Ha nech'Ozu-I n'efu-
Onye-nzoputam!
Mech'ili-Gi n'efu-
Jisus Ezem!
Stanza 3
Onwu ejidegh Gi-
Onye-nzoputam!
I tiw'ogba ili-
Jisus Ezem! Amen.