Abụ 51-55 Nrigo n'elu-igwe Jisọs
- Details
- Written by Administrator
-
Category: Uncategorised
-
Published: 05 June 2019
-
Hits: 1067
ABU 51
Stanza 1
Kraist Ez'ayi biliri ta: Haleluya!
Ka madu na m'ozi si Haleluya!
Kwesienu abu ike; Haleluya!
Igwe na ala, kwenu. Haleluya!
Stanza 2
O lusiwo olu-Ya; Haleluya!
O luwo ogu, merie; Haleluya!
Anwu nk'ezi-omume; Haleluya!
O gagh-anwu kwa ozo. Haleluya!
Stanza 3
Ndi-nche neche nche n'efu; Haleluya!
Kraist etiw'uzo ili; Haleluya!
Onwu ejidegh kwa Ya! Haleluya!
Kraist emeghewo igwe. Haleluya!
Stanza 4
Eze-ayi di ndu ozo; Haleluya!
Onwu, ole ike-gi? Haleluya!
O nwuru, k'ayi we di ndu; Haleluya!
IIi, ole nmeri-gi? Haleluya!
Stanza 5
K'ayi rigokuru Ez'ayi, Haleluya!
Neso Ya, bu Isi-ayi; Haleluya!
Ayi geyi Ya, we bilie; Haleluya!
Nadi ndu nmeri nk'obe. Haleluya!
Stanza 6
To Eze igwe n'uwa, Haleluya!
K'ihe nile neto Gi; Haleluya!
Onye-nmeri, ayi neto I, Haleluya!
To Gi, Nbilite-n'onwu. Haleluya! Amen.
Abu 53
Stanza 1
Isi nke kpururi ogwu
Nekpu otuto ta;
Okpu-eze di bube
Jisus Dinkpa kpuru.
Stanza 2
Oche nke kachasi elu
Bu oke-Ya n'ezie;
Eze nd'eze. Onye'nw'ora,
Ihe ebigh-ebi.
Stanza 3
Onu ndi nile bi n'igwe,
N'onu ndi bi n'uwa,
Ndi mara ihu-n'anya-Ya,
Ndi kwere n'aha-Ya.
Stanza 4
Ha kere oke n'ihere,
Na ngozi nke obe;
Aha-ha di mgb'ebigh-ebi,
Onu-ha bu nk'igwe.
Stanza 5
Ha nahu ahuhu n'uwa,
Ha b'eze n'el'igwe;
Imar'ihu-n'anhya-Ya bu
Uru na onu-ha.
Stanza 6
Onwu ihere O nwuru
Nenye ndi nke-Ya ndu;
Obe-Ya bu olil'anya
Na otuto nke-ha. Amen.
Abu 54
Stanza 1
Ekele! Eze Galili,
Onye eledar'anya!
Jisus, Gi huru ahuhu,
Nye ayi nzoputa n'efu;
Ekele! Onye-nzoputa,
Onye nwuru n'ihi ayi;
N'olu-Gi ka ayi nwer'udo,
Ayi nwere ndu n'aha-Gi.
Stanza 2
Nw'aturu Chukwu rotara
K'O buru nmehie-ayi dum;
Site n'ihu-n'anya ukwu
K'I ji kpuchi nmehie-ayi;
Ndi-Gi nile nwe ngbahara
Site n'ik'obara-Gi;
On'uz'ama nk'igwe meghe,
Ayi na Chukwu di n'udo.
Stanza 3
Jisus, ekele diri Gi
N'och'ebub'ebigh-ebi!
Usu nile nke di n'igwe
Naspur'I n'iru NNa-
N'ebe I narioro ndi-njo,
Nedozir'ayi onodu,
Narior'ayi mgbe ebigh-ebi,
Rue mgbe ayi genw'otuto.
Stanza 4
Gin we nsopuru na ike,
Gin we kwa ngozi nile;
Otuto mgbe ebigh-ebi
Kwesiri ka ayi nye Gi!
Unu ndi-m'ozi nye aka,
Wer'abu oma nile,
Nako olu oma Jisus,
Neto Kraist Immanuel! Amen.
Abu 55
Stanza 1
Anebuli on'uz'ama,
On'uzo gher'oghe;
Ez'ebube agabawo
Inonyere nna-Ya.
Stanza 2
Kraist, I bur'ayi uzo rigo
Idozir'ayi ebe,
K'ayi we no n'eb'I no ugbu a,
Hu kwa iru Chukwu.
Stanza 3
Ih'otuto nenwu mgbe dum
N'uzo-ayi nim'uwa;
Ihe di n'azu igw'oji
Nke zoro Gi n'any'ayi.
Stanza 4
Bulite obi-ayi elu,
Nye ayi amara-Gi;
Ayi nwaghari n'uwa nka,
M'abu-ayi di n'igwe.
Stanza 5
Ka eb'I no, n'aka-nri Nna,
Olil'any'ayi gadi;
Nogide nime ayi, k'ayi we
Nogide kwa nime I. Amen.