The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 313 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Abu 56
 
Stanza 1
Le! O si n'igwe narida,
Ony'egburu n'ihi'ayi;
OPtutu ndi nso neso Ya
Nabu abu nke nmeri;
Haleluya!
Chukwu abia ib'Eze.
 
Stanza 2
Any anile gahu kwa Ya
N'ebube-Ya di ukwu;
Ndi nke kpapuru Ya, re Ya,
Kpogide Ya n'osisi,
Geji kwa
Hu ezi Mesaia-ha.
 
Stanza 3
Ihe-ama nke onwu-Ya
Di kwa n'aru oma-Ya;
Nka nakpatara ndi nke-Ya
Onu di mgb'ebigh-ebi;
Anya gini
K'ayi ji le apa-ntu-Ya!
 
Stanza 4
Ngbaputa, nk'eler'anya-ya,
Aputawo n'ebube;
Ndi nso-Ya, ndi uwa juru,
Geje zute Ya n'elu;
Haleluya!
Ubochi Chinek'abia.
 
Stanza 5
Amen! k'ora madu to Gi,
N'elu oche-eze-Gi;
Were ike na ebub,
Nara ala-eze-Gi;
Biko, bia ngwa,
Chinek'ebigh-ebi, bia! Amen.
 
 
Abu 57
 
Stanza 1
Ndi-ozi Onye-nw'ayi,
Onye na olu-ya,
Necheta okwu O kwuru,
Neche n'on'uzo-Ya.
 
Stanza 2
K'oku-unu nenwu,
Dozienu ya nk'oma:
Kenu ih'okike n'ukwu,
Aha-Ya di egwu.
 
Stanza 3
“Chenu nche! “b'iwu Nn'ayi;
O no kwa nso ugbu a;
Le ih'ama obibia-Ya,
Ka unu jikere.
 
Stanza 4
Ony'agahu na nche
Genwe ezi onu!
O geji onu hu Jisus,
Agasopuru ya.
 
Stanza 5
Kraist geji aka-Ya
We dozie oriri,
Welite ony'ozi ahu
N'iru ndi-m'ozi-Ya. Amen.
 
 
Abu 58
 
Stanza 1
 Nu uda onu! O nabia,
Bu Onye-nzoputa;
K'obi-ayi bur'och'eze-Ya,
K'olu-ayi bua abu.
 
Stanza 2
O nabia izoputa ndi
Ekwensu ker'agbu;
N'iru Ya uzo emeghe,
Agbu dum atopu.
 
Stanza 3
O nabia ikpocha obi
N'ochichiri nmehie:
K'O tinye ihe el'igwe
N'anya onye-isi.
 
Stanza 4
O nabia ikasai obi,
Igwo ndi dara mba;
Iwer'aku-Ya m'ogbenye
K'O gho ogaranya.
 
Stanza 5
Eze udo, Hosanna-ayi
K'ayi geji kele Gi;
Uda-aha-I, di ayi uto,
Gada n'igwe nile. Amen.
 
 
Abu 59
 
Stanza 1
Kraist nabia! K'ih'eker'eke
Ghara is'ude ozo;
K'ayi wer'okwukwe sir'ike
Nele anya-Ya mgbe dum!
Kraist nabia kwa!
Bia, Ez'udo di ngozi.
 
Stanza 2
Ugbu a anako akuku
Nke obe-Gi di ilu;
Ma agahu otuto-Gi
Mgb'I gabia ibu  Eze.
Kraisty nabia kwa!
Ka obi nile nuria.
 
Stanza 3
K'olil'anya nka di ngozi
Me k'ayi bua ab'otuto;
K'ayi welie olu-ayi elu,
Neto Eze nke nabia.
Kraist nabia kwa!
Bia, Jisus, biko bia ngwa! Amen.
 
 
Abu 60
 
Stanza 1
Onye-nzoputam biara Betlehem,
Amuru Ya n'ulo anumanu;
O bu ih'ebube-Onye-ngozi!
O bu mu k'O nacho.
 
Chorus
Mu k'O nacho! nacho!
Mu k'O nacho! nacho!
O bu ih'ebube-Onye ngozi!
O bu mu k'O nacho.
 
Stanza 2
N'obe ka Jisus, Onye-nzoputam,
Kwur'ugwom dum, gbaputa nkpur'obim;
O bu ih'ebube-Onye-ngozi!
Nwuru onwu n'ihim.
 
Mu k'O nwuru! nwuru
Mu k'O nwuru! nwuru!
O bu ih'ebube-Onye-ngozi!
Nwuru onwu n'ihim.
 
Stanza 3
Onye-nzoputam di k'O din a mbu;
Mgbe m'rapuru uzo nefughari-obim,
Nakpom oku! nakpom!
 
Mu k'O nakpo! nakpo!
Mu k'O nakpo! nakpo!
O ji nwayo nario nkpuru-obim,
Nakpom oku! nakpom!
 
Stanza 4
Onye-nzoputam gesi n'elu bia-
Nkwa di uto k'aro nagabiga!
Agamahu Ya k'O naridata.
Mgb'O gabia iwerem!
 
O gabi iwerem!
O gabi iwerem!
Agamahu Ya k'O naridata,
Mgb'O gabia iwerem! Amen.
 
 
ABU 61
 
Stanza 1
Ma Jisus bia ile ndi-Ya olu,
N’ehihie m’ob’abali,
O gahu ayi ezi ndi-Ya na nche,
Jide oku-ayi nenwu?
     
Chorus
Ayi gasi n’ayi ejikere, nwannem,
Iba n’ulo nk’eligwe?
O gahu mu na gi k’ayi neche nche,
Neche, neche mgbe Ez’ayi gabia?
 
Stanza 2
Ma o buru na isi-ututu,
Ka O gakpo mu na gi,
Ka ayi gosi Ya olu ayi luru,
O gasi, “I mere nk’oma?”
 
Stanza 3
A mezuru ihe O si ayi me, 
Neme otu ik’ayi ra?
Ma obi-ayi adigh-am’ayi ikpe,
Ayi gez’ike n’otuto.
 
Stanza 4
Ngozi diri ndi O gahu na nche,
Ha geket’ebube-Ya:
M’O bia n’ututu m’obu n’abali,
O gahu k’ayi neche nche?     Amen.
 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 41 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.