The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 313 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Abu 72
 
Stanza 1
Okwu nke ghoro madu,
Amam-ihe nk'igwe,
Ez'okwu nenwegh ngbanwe,
Ih'ayi n'ochichiri;
 
Ayi to Gi n'ihi ihe
Si n'Okwu nso-I puta;
Oku diri ukwu-ayi,
Nenwu mgb'ebigh-ebi.
 
Stanza 2
Nzuko nka Kraist natara
Okwu Chukwu ahu;
o bulir-ihe ahu
K'O mukwasi uwa.
 
O bu igbe nke aku
Juru n'Ezi-owu;
Obu ezi onyinyo
Nke Kraist, bu Okwu Ndu.
 
Stanza 3
O di ka okoloto
N'iru nd'agha Chukwu;
O bu oku nagb'ama
N'ochichiri uwa;
 
Ob'ihe nego'uzo
N'osimiri ndu nka,
Nime ihe ize-ndu ,
Dur'ayi biakute Kraist.
 
Stanza 4
Jisus me ka Nzuko-Gi
Di k'oku nenwu'enwu,
Nke gegosi mba nile
Ihe-I k'o di na mbu;
 
Zi ndi-ije-Gi nile
Ka ha soro Ihe a 
Rue mgb'ochichiri gebi,
Ha hu iru-I n'onu.   Amen.
 
Abu 73
 
Stanza 1
Chineke, okwu-I di
Iduzi ukwu-ayi;
Onye kwer'okwu ya
Nwere ihe n'onu.
 
Stanza 2
Mgbe nd'iro no nso ayi,
Okwu-I nagb'ayi ume:
Okwu nkasi-obi,
Ozi nke nzoputa.
 
Stanza 3
Mgb'ochichi nagbachi
Igw'oji kpuchie ayi,
Ihe-ya nedu ayi,
Necheber'ayi uzo.
 
Stanza 4
Onye mara onu,
Pur'iguko aku,
Nke okwu-Gi nenye
Obi di um'ala?
 
Stanza 5
Okw'ebere, nenye
Ndi di ndu amara;
Nke okwu-Gi nenye
Ndi nanwu nkas'obi !
 
Stanza 6
Chukwu, kwe k'ayi chota
Ihe-nmuta nso-ya;
K'ayi pu kwa Gi n'anya,
Nakpa nso I mgbe nile.   Amen
 
Abu 74
 
Stanza 1
Akwukwo Nso Chineke,
Gi B'akum di ok'onu;
Nkem, igwam ebe m'si bia;
Nkem, izi kwam ihe m'bu.
 
Stanza 2
Nkem, ibam nba ma m'kpafue,
Gosi kwa ihu-n'anya;
Nkem k'I bu idu ukwum,
Mam ikpe, kpeputakwam.
 
Stanza 3
Nkem, ikasim n'ahuhu,
Ma Mo Nso weta ngozi;
Nkem, igosi okwukwe
Madu ji meri onwu.
 
Stanza 4
Nkem, ikow'onu nabia,
Ihe, ndu, m'onwu gasia;
Akwukwo nso Chineke,
Gi b'akum di ok'onu!  Amen
 
Abu 75
 
Stanza 1
Nyawaram achicha
Nke ndu, Chukwu,
Dika I si ke nri
N'uso miri.
M'nacho Gi, Onye-nwem,
N'Akwukwo nso;
Agu Gi nagu mom,
Okwu di ndu.
 
Stanza 2
Gi bu nri nenye ndu,
Gi Onye-nwem;
Ezi-okwu nso-Gi
Nazoputam.
Nyem ka m'rie we di ndu
\Soro I n'elu;
Zim ka m'hu ez'okwu-I
N'anya, Jisus.
 
Stanza 3
Biko, Nna, Ziterem
 Mo Nso-I ugbu a,
K'O met'aka n'anyam
Ka m'huw'uzo.
Gosim ih'ezoro
Nime Okwu-I
Ka m'hu k'Akwukwo nso
Kpughere Gi.
 
Stanza 4
Gozie Okw'om'ahu
N'ebe mu no,
K'I si we gozie nri
Na galili.
Ino n' otru gebi,
Ogba tijie;
Agamahu udo,
G'ihem nile!   Amen.
 
Abu 76
 
Stanza 1
Bia n'etiti ayi Chineke;
Jiker'ayi inu okwu-Gi,
Do nti ayi n'inu olu-Gi,
Nye ayi okwukwe k'ayi we nu.
 
Chorus
Gozie ndi nejere I ozi ,
Me k'Ozi Oma-Gi gbasa.
 
Stanza 2
Wepuru ayi uche abua,
tukwasi obi-ayi n'elu;
nye anyi nri sitere n'igwe,
Me k'afo nri nke ndu ju ayi.
 
Stanza 3
Wer'ike nke Mo Nso nke-Gi,
kua okwu nke-Gi n'obi-ayi,
K'ayi wer'okwukwe na egwu
Neme otu ayi nur'ugbu a.
 
Stanza 4
Nna, gosi ayi Opkara-Gi,
Me k'ayi mar'ihe I nacho;
Weputa ike-Gi n'ihe,
Dusi ayi n'ala otuto.  Amen
 
 
Abu 77
 
Stanza 1
Kwue, mgb'oge dajuru,
Mgbe m'no niche gi;
Me k'obim nana nti,
Neche okwu-Gi.
 
Stanza 2
Kwue, O Nna di ngozi,
N'oge a dajuru;
ka m' hu iru-Gi, Nna,
Mara ike-Gi.
 
Stanza 3
N'ih'okwunk'I nekwu,
“Ha bu ndu” n'ezie;
Nrui nk'igwe nenye ndu,
Zuba mom ugbu a !
 
Stanza 4
Ihe dum m'erapuru,
Enweghkwam onwem;
Onu ka m'ji nye Gi,
Ihe nile nkem.
 
Stanza 5
Kwue, Nna, n'oru-I nanu !
Agbala nkiti;
Nkpur'obim neche Gi,
Okwu nenye ndu!
 
Stanza 6
Mejuem n'amam-ihe
Nk'uch'ebube-Gi;
K'ih'uto I nacho
Zur'oke nimem.
 
Stanza 7
Dika “alab oma”
Nke nasu miri
Nesi isi oma,
Ka m' no n'iru Gi !
 
 
Abu 78
 
Stanza 1
Bu-kwa-ram abu ndia ozo,
Okw'ebube nke Ndu !
Ka m'hu kari nma-ha ra,
Okw'ebube nke Ndu !
Okwu nke ndu di nma,
Zim okwukwe n'olu !
 
Chorus
Okwu oma! d'itu-n'anya !
Okw'ebube nke Ndu !
 
Stanza 2
Kraist, Onye-ngozi, neny'ayi dum
Okw'ebube nke Ndu !
Ndi-njo, genu nti oku'ahu,
Okw'ebube nke ndu !
Enyer'ora n'efu,
Nakpo ayi bia n' igwe !
 
Stanza 3
Ol'uto nk'Ozi'oma nakpo,
Okw'ebube nke ndu !
Neny'ora ngbahara n'udo,
 Okw'ebube nke Ndu !
Kraist, Onye-nzoputa,
Do ayi nso mgbe nile !   Amen
 
 
Abu 79
 
Stanza 1
Mo Nso kekunye okw'ume,
Ezi'okwu we puta;
Ozizi na nkwa nenye ayi
Ihe nedo anyi no.
 
Stanza 2
Ututo, dika nke anwu,
Neme k'okwu nso nwue
Nenye ogbo nile ihe:
Ihe-ya zur'ezu.
 
Stanza 3
Aka nyere ya nenye kwa
Ihe n'oku nk'obi;
Ezi'okwu-ya nawaliri
Ndi-mba: o gagh-ada.
 
Stanza 4
K'ekele diri gi mgbe dum
N' ihi'okwu di otu a,
Neme k'ihe nk'igwe nwuba
Nim'uwa nk'ochichi.
 
Stanza 5
O nato obim ijeso
Onye m'huru n'anya,
Rue mgb'otuto genwukwasim
N'al'eze nk'el'igwe.   Amen
 
 
Abu 80
 
Stanza 1
Oriona diri ukwu-ayi,
Negosi ayi uzo;
Is'iyi nk'esi n'amara
Nk'el'igwe nye nd'ije.
 
Stanza 2
Nri nke nazu nkpur'obi-ayi,
Ezi nri si n'elu;
 Ihe-ndu, ebe ayi nagu
Banyere el'igwe.
 
Stanza 3
Ogidi-oku n'abali,
igw'oji n'ehihie;
Mgbe ifufe nefegid'ayi.
Ebe-ngbaba d'ike.
 
Stanza 4
Okwu Chukwu ebigh-ebi,
Uche Okpara-ya;
I nedu nzo-ukwu n'uwa,
Nezi uzo nk'igwe.
 
Stanza 5
Chukwu, kwe k'ayi muta nk'oma
Amam-ihe nke ya;
natughari ozizi-ya
N'okwukwe nke nwata.    Amen
 
 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 19 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.