The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 313 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Abu 8
 
Stanza 1
Chukwu ebigh-ebi, Ony'amam-ihe,
Oke ihe-Gi kpudoro anya-ayi;
Gi nw'otuto n'ike, Nna di mgbe ochie;
Ayi neto aha-Gi, Onye nwe nmeri.
 
Stanza 2
Gi ji ike n'uche, nachi ihe dum;
Ihe-Gi ji nwayo nenwu n'el'uwa;
Ez'ikpe-Gi kasi ihe dum elu;
Gi bu Onye nwe ihu-n'anya ukwu.
 
Stanza 3
Gi nenye ora madu ume na ndu;
Ndu ahu nke I nyere bu ndu n'ezie;
Ma dika osisi k'ayi nami nkpuru,
Ayi nanwu nagafe-Ma I nogide.
 
Stanza 4
Chineke nk'otuto, Nna nke di ngozi,
Ndi-m'ozi neto kwa Gi n'elu-igwe;
K'ayi nye Gi otuto, nna nke bu ihe,
Chukwu ebigh-ebi, Ony'amam-ihe. Amen.
 
 
Abu 9
 
Stanza 1
Chinekem, I d'itu-n'anya,
Ebube-Gi nenwu;
Och'ebere-Gi di no nma
Nime oke ihe.
 
Stanza 2
I di egwu, Chineke nkem,
Nna di ebigh-ebi;
Ndi-m'ozi nada n'ukwu-Gi,
Nefe Gi mgbe nile.
 
Stanza 3
Iru-Gi mara nma n'ezie;
Amam-ihe nke-Gi,
Na idi-ocha n'ike-Gi
Di kwa ok'ebube.
 
Stanza 4
Le, ka m'si atu egwu-Gi,
Chineke nke di ndu;
Nefe Gi n'ezi ncheghari
N'olil'anya nk'igwe.
 
Stanza 5
Ka m'hu Gi n'anya, Chineke,
Gi, Onye di ike,
N'ihi na I nario n'akam
Ihu-n'anya nk'obim.
 
Stanza 6
Nnaa nke Jisus, Nna nk'amara,
Ida n'ir'oche-Gi,
Na ilekwasi iru-Gi,
B'onu ebigh-ebi. Amen.
 
 
Abu 10
 
Stanza 1
Chineke di nma; n'el'igwe,
N'akuku nile nke uwa,
K'otutu olu naza, si,
Chukwu, Onye ker'ayi, di nma.
 
Stanza 2
Anyanwu nke nag'ije-ya,
Nasmus'ihe nile n'uwa,
Usu mbara nke el'igwe,
Ha dum nasi, Chukwu di nma.
 
Stanza 3
Umu-nnunu ndi ji onu
Nabu abu-ha kw'ubochi;
Miri-ozuzo n'ikuku
Nekwu nwayo: Chukwu di nma.
 
Stanza 4
Anurum ya nim'ok'ohia,
N'el'ugwu na osimiri;
Ha nile nesonye n'abu,
Nekwus'ike: Chukwu di nma.
 
Stanza 5
Ihe nile ekere'eke
Nekwu si, Chineke di nma;
Madu j'onu neto s'ike,
Naza n'abu: Chukwu di nma.
 
Stanza 6
Ayi neso ihe dum nk'uwa
Neto Gi, Onye-amara;
Ma nke ka, n'ihi Jisus Kraist,
Ka ayi gasi, Chukwu di nma! Amen.
 
 
 
ABU 11
 
Stanza 1
Chuk’Ony’Okike
Nke uwa n’el’igwe,
Onye ker’anyanwu,
Nelekotam.
 
Stanza 2
Onye ker’ohia,
Osisi na nkpuru,
Ehihie n’abali,
Nelekotam.
 
Stanza 3
Onyr ker’anwu,
Onwa na kakpando,
Mgb’ahuhu biara, O
Nelekotam.
 
Stanza 4
Ya ziri Nwa Ya
K’O nwua na Kalvari;
Ma m’dabere Ya, O
Gelekotam.
 
Stanza 5
Mgbe m’ruru n’igwe,
Ma hu ndi-eyi-Ya,
M’geso ndi nso bua: O
Lekotaram!   Amen.
 
 
ABU 12
 
Stanza 1
Abu nke ndi-m’ozi nada
N’och’eze-I mgbe dum;
Okpukpo-ubo ndi-m’ozi
Enwegh iz’ike;
Ha di ndu nani igozi I,
N’ikwuputa I
Nna nk’ike.
 
Stanza 2
Gi Nke bi n’ebe di anya
Kari k’ayi gahu;
O gabu na I nege nti
N’abu ndi-nmehie?
Ayi pur’ima n’I no nso ayi,
N’I gahu ayi?
E, n’ezie!
 
Stanza 3
E, ayi mara n’I nanuri
N’olu-Gi nile;
I ker’aka, n’olu na nti,
Inye I otuto;
Olu ndi-nka, n’olu abu,
Jikoronu
Ito Gi.
 
Stanza 4
Chuku, n’ulo-Gi k’ayi neche
Ihe-Gi n’iru I;
Ayi ji ekwesigh-ekwesi
Newetara Gi
Obi, n’uche, n’aka, n’olu,
N’abu-ayi n’ike
Kasi nma.
 
Stanza 5
Nsopuru, otuto n’ike,
Gabu nke-I mgbe dum:
Nna, na Okpara, na Mo Nso,
Ato nim’Otu;
Ihe kasi nma nk’I nyere,
Uwa n’igwe
Nenye Gi.  Amen.

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 42 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.