The Most Rev'd Dr. C. A. Manduoma (JP)
The Archbishop of Owerri Ecclesiastical Province
and Bishop of Ideato
Calendar
Event Title...SYNOD Saturday, April 25, 2020 02:00 PM 139 Days

Osina Women at the Diocesan Women Conference 2019

Diocese of Ideato @20

Abu 91
 
Stanza 1
N'ihi ndi nso, nez'ike n'olu,
Ndi ji okwukwe kwusa Gi n'uwa,
K'aha-Gi, Jisus, bur'aha ngozi.
Aleluya !
 
Stanza 2
Gi b'ebe-ngbaba, nkume, n'ike-ha;
Gi b'Ochi-agha n'agha-ha nile;
Gi nim'chichiri b'ez'ihe-ha.
Aleluya !
 
Stanza 3
Ka ndi-agha oma-Gi, ndi d'ike,
Lua ogu-ha ka ndi nso nke mgb'ochie,
Soro ha nweta okpu nke nmeri.
Aleluya !
 
Stanza 4
Nriko di ngozi, nnweko nke di nso !
Anyi nalu ogu, ha no n'otuto;
M'ayi b'otu nime Gi, ayi dum bu nke-I.
Aleluya !
 
Stanza 5
M'agha d'ufu, ogu alugide,
Nti nanu abu nmeri nk'el'igwe,
Obi nwe ik'ozo, aka d'ike.
Aleluya !
 
Stanza 6
Anyanwu nenwu s'ike n'anyasi,
Nd'ogu ndi kwesiri gez'ike ngwa;
Ngozi nk'udo nke Paradis d'uto.
Aleluya !
 
Stanza 7
M'ubochi otuto ka nma gabo;
Ndi nso gebili n'uwe nmeri-ha,
Eze nk'otuto naga n'uzo-Ya !
Aleluya !
 
Stanza 8
Site n'ala, n' osimiri nile,
Usu agutagh-onu nezuko,
Naburu Nna, n'Okpara, na Mo Nso.
Aleluya ! Amen.
 
 
Abu 92
 
Stanza 1
Onye-nwe-ndu, eb'o bula
Ha no n'ebigh-ebi nke-Gi,
Ndi-ayi nwuru nadiri Gi.
Haleluya !
 
Stanza 2
Gi nw'obi dum, n'ebe nile,
Ha nez'ike n'okpuru Gi,
Ha keta otu nchebe-Gi.
Haleluya !
 
Stanza 3
Okwu-I b'ezie, uzo-I di nma;
“Ntu lara ntu”, m'ayi bukari
Abunke ntukwasi-obi.
Haleluya !
 
Stanza 4
Ndi nwuru na Gi no n'onu,
Egwu agagh-atu h'ozo;
N'onwu na ndu, ha nwe ngozi.
Haleluya ! Amen.
 

Primate

The Most Revd. Nicholas Dikeriehi Orogodo Okoh

Admin

Who's Online

We have 137 guests and no members online

  • The Peace of the Lord be with you (John 14:27:)
  • Ven. Josiah Ihekwoaba
  • Ven. Ramsay Okeke
  • Ven. Clifford Nwigwe
  • Ven. CSO Ukachukwu
  • Ven. SUC Ugochukwu
  • Ven Alexander Oji
  • Ven. Davidson Nwokeji
  • Ven. Godson Unozo
  • Ven. Paul Nwosu
  • Ven. Chima Nwigwe
  • Ven. Frank Ikeh

Akokwa Women at the Diocesan Women Conference 2018.